Egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọku na Taraba

Ndị uweojii Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue na Taraba maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi

Nsogbu amalitela ọzọ na gburugburu Mambila plateau dị na Taraba Steeti nke mere ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na-egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Yelwa na Mesamari dị na Sardauna Local Government na Steeti a.

N'agbanyeghị na ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na-egburu ihe karịrị mmadụ 40 na mwakpo a ha sị bidoro n'abalị Satude, ndị uweojii na Steeti ahụ gwara BBC na ha amaghị mmadụ ole ihe metụtara.

Ndị uweojii kwuburu na mmadụ ise nwụrụ na mwakpo nke e mere na Tụsde mgbe ndị Fulani na ndị Mambila nwere esemokwu.

Mana mwakpo a mekwara n'abalị Satụde ma ruo Sọnde, butere ogbugbu ọtụtụ mmadụ.

Ndị uweojii na-akọwa na ebe ihe a mere jụzịrị oyi ka ha zipụrụ ndị uweojii gburuguru ebe ihe a na-eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: