Okwu Tony Ezimakor: Gọọmentị ana-akpachị mgbasa ọzi?

Tony Ezimakor Image copyright Daily Independent
Nkenke aha onyonyo DSS nwụchiri Tony Ezimakor n'ihi na ụlọ akụkọ nke oso n'isi ya dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru maka ụmụaka Chibok

Ngalaba nzuzo na-ahụ maka nchekwa nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ nwụchiri onyeisi ọrụ ụlọ ntaakụkọ Daily Independent na mpaghara Abuja bụ Tony Ezimakor ụbọchị Wenesde, ọnwa Febrụwarị 28, nke afọ n'ihi na ụlọakụkọ ha dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru iji napụta ụfọdụ ụmụaka Chibok n'aka ndị Boko Haram.

Ka ọnwa Febrụwarị dị iri abuo na abụọ, Daily Independent dere akụkọ nke kọwapụtara otu mba Switzerland siri nyere gọọmentị etiti aka iji ego ruru nde kwuru nde dọla gọpụta isi ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram tọpụrụ, na etu ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti si jiri ohere ahụ ya fọjuo akpa ha.

Na nkọwa ya n'ụnyahụ bụ Monde, onyeisi ọrụ na-ahụ maka ibipụta akụkọ na Daily Independent bụ Don Kere gwara BBC n'ekwenti na Ezimakor ka nọ n'ogige ndị DSS.

Kere - onye kwuru na ọ bụ ya ka ndị DSS gara anwụchi, ma mgbe ha enwetaghị ya, ha ziri ozi ka onye nnọchite anya ha n'Abuja bịa n'ụlọọrụ ha - kọwara na ọ bụ akụkọ ụlọ ntaakụkọ ha dere banyere ego gọọmenti etiti nyere ndị Boko Haram iji gbapụta ụfọdụ ụmụaka Chibok bụ ihe mere DSS jiri nwuchie onye ọrụ ha.

Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na gọọmenti etiti na-akpachị mgbasa ozi n'ikike ndị mmadụ nwere imata ihe na-eme n'obodo.

"Ọ dịzị ka anyị anọ n'ọchịchị ndịagha maka ha achọghị ka ndị mmadụ mata ihe na-eme n'obodo. Onye kwuo, ha ejide ya."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ọtụtụ otu ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye akpọla oku ka DSS hapụ nwaamadị ahụ na-enyeghị ọnọdụ ọbụla.

Otu onye na-ahụ maka ikike dịrị ndị ntaakụkọ bụ Lanre Arogundade, kwuru na ị nwụchi ma jichie Ezimakor bụ ikpachi mgbasa ozi na ikike onye kwuo uche ya.

Arogundade bụkwa onyeisi International Press Centre, Lagos, gara n'ihu sị," Anyị na-agwa DSS ka ha tọghapụ nwa amadị ahụ na-enyeghị ọnọdụ ọbụla maọbụ ha kpụpụ ya ụlọikpe."

Mbọ anyị gbara iji nweta ebunuche onye isi ndị ntakụka n'ala anyị bụ Waheed Odusile amịtaghị mkpụrụ. Mgbe onye ntaakụkọ anyị kpọrọ ya, ọ kwuru na ya ji ihe dị oke mkpa n'aka.

Na nsonso inwụchi na isogbu nke ndị ntaakụkọ bulitere mkparita ụka na ọchịhị Muhammdu Buhari na-emegide ikike onye kwuo uche ya na Najiria n'ihi ọtụ ndị mmadụ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị a nwụchiri n'oge a.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na Twitter:

Ndị ntaakụkọ anwụchiri n'oge Buhari gunyeree:

1. Ndị otu ndị uweojii a kpọrọ SARS nwụchiri Daniel Elombah, onye nwe, 'Elombah.com,' n' ọnwa Janụwarị 1, afọ 2018 maka ide ihe katọrọ Buhari

2. Ndị uweojii nwụchịri Jacob Onjewu Dickson n'afo 2016 maka ide na ndị ntorobịa tụrụ Gọvanọ Kaduna State, Nasir Elrufai, okwute

3. Ndị uweojii nọ n'Abuja wakporo Muhammad Atta-Kafin-Dangi, onye ntaakụkọ radio Nigeria maka ịgba ka ọ gbasa ozi banyere ngarịiwe nke ndị na-agba ọkada mere

4. Ụbochi iri abụọ na ise nke ọnwa Juun afọ 2016, ndị ọrụ Custom kụrụ onye ntaakụkọ,Yomi Olomofe Muhammad isianbaokpu na ogige ha dị n'a Lagos

5. Na ọnwa Ogostụ 2016, EFCC nwuchiri onye ntaakụkọ websait bụ Abubakar Sidiq Usman na Abuja

Chetakwa na nsonso, ozi pụtaranụ kwuru na ụlọomeiwụ nke ukwu bụ Sineti na-akpa nkata ime iwu ka a kwugbuo onye ọbụla a mara ikpe ikwu okwu asị nke a kpọrọ 'hate speech' na bekee.