Ndị otu #Mumudondo chọrọ ime ngagharị iwe
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Charlie Boy: Iwe anyị bụ na a na-emechi ndị ntaakụkọ ọnụ

Ọ bụrụ na-enweghi ihe mgbochi ọbụla, ndị otu #Mumudondo nke Charles Oputa (Charlie Boy) akwadosila njeghari iwe ha ga-eme n'Abuja ụbọchị Wednezde maka onyeisi ụlọọrụ mgbasa Daily Independent ndị ọrụ DSS jidere.

E jidere Tony Ezimakor n'Abuja maka akụkọ ndị ụlọọrụ Daily Independent mere gbasara ego e kwuru na ndị gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ndị Boko Haram.

Ndị DSS ji Tony kamgbe ụbọchị 28 Feburuwarị afọ 2018 ka o kwuo ebe ha si weta akụkọ ahụ ha buru.

Akụkọ ndịụ ọzọ ga-amasị gị: