George Weah arịọla ka Naịjirịa binye ha ụfọdụ ndị nkuzi

George Weah Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo George Weah bụ onye egwuregwu AC Milan na Chelsea mgbe ọ na-agba bọọlụ

Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ ụnyahụ na Aso Rock dị n'Abuja dịka Weah bịara Naịjirịa nke mbụ kamgbe ọ bụrụ onyeisisala.

Ihe pụtara n'ọgbakọ ahụ bụ na Weah rịọrọ onyeisiala Buhari ka Naịjirịa binye Liberia ndị nkuzi ruru puku isii.

Weah kwuru na nke a bụ ka Naịjirịa jiri nyere mba Liberia aka dịka nkwekọrịta dị n'etiti maba abụọ ahụ.

Dịka Weah gwara ndị ntaakụkọ ka ha mechara ọgbakọ ahụ, o kwuru na gọọmenti ya natara ọtụtụ nsogbu, ma na-arịọ ka Naịjirịa nyere ya aka.

O kwuru na nsogbu kachasị n'ala ha bụ ndị ntorobịa enweghi ọrụ nakwa mkpa ọ dị ikpọlite agụmakwụkwọ n'obodo ahụ, ọrụugbo, ọrụ ahụike na ndị ọzọ.

Gọọmenti Naịjirịa depụtara site n'akara ha na twita ihe onyeisiala Naịjirịa mere taa.

Ihe ndị Naịjirịa chere maka ibinye Liberia ndị nkuzi:

Ụfọdụ ndị Naịjirịa n'akara twita ekwupụtala ebumnobi ha gbasara arịrịọ ahụ onyeisiala Liberia mere.

Wole Elegbede kwuru na nke a bụ ohere ndị nkuzi Naịjirịa nwere iji nyere onwe ha aka.

Folarin Flo n'akụkụ nke ya na-ajụ ma Naịjirịa enwere ndị nkuzi ga-ezuru ha, nke inye Liberia.

A.B Abdullahi kwukwara na ndị Liberia nwere ike tinyekwuo ọnụọgụ ndị nkuzi ha chọrọ nihi na Naịjirịa na-achọ ụzọ a ga-esi nye ndị notrobịa ọrụ.

Ihe ndị Liberia chere maka Naịjirịa ibinye ha ndị nkuzi:

Onye kpọrọ onwe ya A na twita nke si Liberia kwuru na ya aghọtaghị ihe kpatara onyeisiala ha ga-eji rịọ ndị nkuzi.

Cheta na steeti kaduna chụrụ ndị nkuzi ha niile maka na ha erughi ihe a chọrọ n'ọrụ nkuzi, keduzi etu Naịjiịra ga-esi binye ndị mba ọzọ ndị nkuzi?

Ndị nkuzi ahụ gọvanọ Nasir El-Rufai Kaduna steeti chụrụ ruru puku iri abụọ na abụọ.

El-Rufai kwuru na ihe kpatara ya ji chụọ ha bụ na ha etozughi etozu.


Akụkọ ndịụ ọzọ ga-amasị gị: