Agwọ loro ego: EFCC anwụchiela ndị ụlọọrụ Jamb

agwọ cobra Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb maka agwọ lolo ego

Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka nyocha mpụ na nrụrụaka bụ Efcc anwụchiela ndị a na-atụaka n'ọrụ ha bụ ibupu ego dị n'akpa Jamb site n'ụzọ n'ezighị ezi.

Philomena Chieshe bụ nwaanyị kwuputara n'agwọ loro nde naira 36 n'ụlọọrụ ha na Makurdi, so na ndị Efcc gbakwara ajụjụ ọnụ gbasara ego dị n'akpa Jamb.

Ndị nchọpụta gara n'ụlọọrụ ha kwuru na Chieshe kwuputara na ọ bụ onye nhazi ha bụ Samuel Umoru ka ọ nọ na-enye ego ahụ ntakịrị ntakịrị.

Ka ọ na-eme nkwuputa n'aka ndị Efcc, Chieshe bụ onye odeakwụkwọ n'ụlọọrụ Jamb nke Makurdi gwara ha na Umoru na-agwakarị ya wepụtara ya ego ha retere site n'akpa ego ya dị n'ụlọakụ abụọ.

Ha chọpụtara na tupu ihe bekee kpọrọ Treasury Single Accounts apụta ihe, ndị ụlọọrụ Jamb nọ na-etinye ego ha retere n'ime akpa ego a na-akwadoghị, nke butere ofufu ọtụtụ ijeri naịra.

Chieshe gwara Efcc "Ego a m na-ewepụta, onye nhazi na-eji ya eme ihe ndị gbasara ụlọọrụ nakwa onwe ya ụfọdụ oge."

O kwukwara n'oteela o bidoro ịdọ Umoru aka na ntị, sị na o kwesịghị iji ego ahụ mee ụmụ ururu ihe dị n'ụlọọrụ nakwa ihe gbasara onwe ya, mana ọ kweghị ege ya ntị.

O kwukwara ma Umoru nọ na-amịpụ 'eji m gị ụgwọ' site n'ego ha retere na kaadị ahụ kwa mgbe, n'akwụghachịghị ya.

Image copyright @JAMBHQ
Nkenke aha onyonyo Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb

Chieshe kwuru "Ọ gwara m dọpụtara ya N640,000 n'etiti ụbọchị 30 nke ọnwa Juun na ụbọchị 7 nke ọnwa Julaị nke 2014."

Ọ kwukwara na ọ dọpụtakwaara ya N120,000 na N340,000 site n'ọnwa Mee ruo Julaị.

Ndị nyocha chọpụtara na ọ bụ eziokwu na Umoru dọpụtara ego ndị a ka ha nyochachara akwụkwọ nkọwa nke akpa ego Chieshe.

Anwụchiri ma gbaa Umoru ajụjụọnụ tupu a hapụ ya ka ọ gawa.

Otu onye Efcc kwuru sị "Ihe kacha akpalite uche na nkwuputa a bụ na anatala ndepụta Chieshe tupu mgbaama agwọ na ego oloro apụta ihe.

"E bu ụzọ gbaa ya ajụjụọnụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwarị 2017 ma mekwaa nkwuputa n'ụbọchị 7 nke Epreelụ, ụbọchị 30 nke Mee na ụbọchị 28 nke Juun 2017.

N'ime ihe niile ọ gwara n'ihu ndị Efcc, onweghị mgbe ekwuru okwu gbasara agwọ na ofufu ego dị n'aka ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a