Ọkụ Timbashed: Ugwuanyi si na gọọmenti ya ga-enye aka

Ọkụ Timber Shade
Nkenke aha onyonyo Ọkụ Timber Shade Metụtara ọtụtụ mmadụ

Gọọmenti Enugwu steeti amapụtala nde naira 14 na ụma iji malite ngwa ngwa irụghari ahia Timbashed gbara ọkụ n'Enugwu.

Gọvanọ IFeanyi Ugwuanyi kwuru na nkea bụ iji ji hichaa ndi ahia ọkụ gbapiara ụlọ na ngwa ahia ha anya mmiri.

Ugwuanyi na Osote ya bụ cecilia ezeilo soro wee gaa ya bụ njem nleta.

Ọ gwara ndi isi Timber Shade ka ha jiri Obi chukwu were depụta aha onye ọbụla ọkụ gbara ihe ya na ya bụ 'Line' Abụọ na atọ.

Nkenke aha onyonyo A na-ere osisi di icheiche na Timber Shade

Onye isi otu jikọrọ ndi ahia na Timbashed bụ Levi Obi kwuru na ọñụ juru ha obi ka Govano Ugwuanyi Siri were ngwa ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka.

Okwere nkwa na ya bụ nde naira iri na anọ na uma bụ nke ha ga eji rụba ụlọ ahia 72 ahụ gbara ọkụ ozigbo na emegbụghị onye ọbụla.

Onye isi oche ọkpụrụ ọchịchị Enugwu south bụ Sunday Ugwu kelere Govano maka ịnụ mkpu akwa ndị ọ na achị.

O nyere ndị ahịa iwu ka ha na agbanyụ ọkụ latrik ma ha mechie ahịa ụbọchị ọbụla, ma tọkwaa anya n'ala hụ na ha gbanyuru ọkụ ọbụla ma ọ bụ Igwe eji arụ ọrụ nwere ike ibute ọkụ ọgbụgba.

Gọvanọ Ugwuanyi na osote ya bụ Cecilia Ezeilo, kọmishọna ọrụ na akụrụngwa dị na aka bụ Greg nnaji, ode akwụkwụ ụlọ ọrụ na ahu maka mberede na enugwu steeti bụ Nkechi Eneh na kwa ndị sọrọ wee mee ya bụ njem nleta.

Ugwuanyi gwara ha na ngwa ngwa aruchara ya bụ ụlọ azụmahịa gbara ọkụ, na ya ga-enyekwa ndị nwe ya bụ ọbọ ahịa 72 ego dị nde naira asaa na uma abụọ, ka ha were gochie osisi na igwe ọrụ ha ma malite ahia ozigbo.

Ọtụtụ ndị ọkụ ahụ metụtara bụ Tony Aja, chukwunonso Nnamchi, Charles Nweke na IFeanyi Eze kwuru na obi di ha ọcha maka ego ahụ amapụtara iji nyere ha aka. Ha yọkwara gọọmenti ka owere brill wee rụgharịa ya bụ ụlọ ahịa ka ewee gbochie ọkụ na odịnịhụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara