Nnwereonwe Ghana: Ejije, nri na ekele ha na twitter

Getty Images Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Na ọgụgụ mmadụ emere n'afọ 2014 Ghana nwere mmadụ ruru nde iri abụọ na asaa.

Mba Ghana na-eme mmemme ncheta ụbọchị nwereonwe ha taa bụ ụbọchị isii n'ọnwa Maachị, nke mere ha dị afọ 61 taa.

N'elu igwe okwu ọhụrụ bụ tiwita, ndị ụmụafọ ala Ghana apụtaala na-ekele onwe ha maka mmemme nke a.

Mana n'ime anụrị a, o nwere ndị na-ewe ezigbo iwe maka ihe na-eme n'ala ha gbasara ndị ọchịchị ha.

Onye na-eme ihe nkiri a ma ama bụ John Dumelo kwuru na o nweghi ihe ha na-anụrịrị maka na ọtụtụ ndị mmadụ na-ata ahụhụ n'obodo ha. O kwuru na ụmụakwụkwọ na-amado afọ n'ala agụ akwụkwọ na Yikurugu gunyere ajọ ihe ndị ọzọ na-eme n'obodo ha.

Ihe ọzọ ndị ụmụafọ Ghana na-eme na tiwita maka mmemme nwereonwe ha taa

Mr Miyagi gosipụtara nri o ji eme ya bụ mmemme.

Image copyright @DiceAiles
Nkenke aha onyonyo Kenke bụ nrị ala Ghana

Ido Ghana gosipụtara njirimara Ghana na ihe gbasara ejije dịka akwa Kente, aka, ite a kpụrụ akpụ na ihe ndị ọzọ.

Image copyright @sprinklesOfgh
Nkenke aha onyonyo Akwa kenke bụ akwa ndị Ghana puriche

Anyị anaghị echefu na arụmụka Jollof Rice Ghana ka dịkwa.

Image copyright @sprinklesOfgh
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa na Ghana ka na-enwe arụmụka onye kachasị esi nrị Jollof rice.

Ọ nwekwara ndị na-enwe olileanya na ọ ga-adị mma na ọdịnaihu.

Mika Abraham kpere ala ha Ghana ekpere ka ndị na-achị mepe ohere ga-ewetara ha agamnihu.

N'akụkụ nke ya, Mensa Otabil gwara ndị ntorobịa Ghana ka ha ga n'ihu na-enwe olileanya ma na-amakwa ndị ọchịchị ha aka n'ihu gbasara ihe na-eme n'obodo ha.

Ghana nwetara nnwere onwe ha n'aka ndị Britain n'afọ 1957.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara