Jamb na EFCC: Onyeisi m narala m naịra 36nde ahụ

EFCC na agwo e boro ebubo na o loro ego Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị EFCC na-eme nyocha banyere mpụ dị na Jamb

Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ịchụ mpụ ọsọ bụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) n'aha ịchafụ ekwuola na ha na-agba ndị ọrụ Jamb bụ Philomina Chieshe ajụjụọnụ.

Chieshie bụ onye kwuburu na agwọ loro ego ruru naịra 36 nde nke ndị Jamb retere na kaadị ule.

EFCC kwuru na ha gbara Chieshie na onyeisi ya na ụlọọrụ Jamb dị na Makurdi Benue steeti Samuel Sale Umoru ajụjụọnụ.

Image copyright @JAMBHQ
Nkenke aha onyonyo Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb ndị ọzọ a na-ele anya na aka ha dị na ya

Mana ugbua, Chieshie ekwugharịala ihe o kwuburu na mbụ, o kwuola ugbua na ọ bụ oga ya Umoru nara ya ego ahụ na ọ bụghị agwọ loro ya.

Nchọpụta ndị a nọ n'akwụkwọ ndị EFCC wepụtara dịka ndị mmadụ na-akatọ EFCC na onweghi ihe ha mere gbasara ebubo nwaanyị ahụ boro agwọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLekwa agwọ loro nde naira 36

Ndị EFCC na-agba ya ajụjụọnụ kemgbe ha bidoro nyocha gbasara akataka mpụ na ohi na-aga n'ụlọọrụ EFCC.

Chieshe gwara ndị EFCC na ọga ya bụ Samuel Sale Umoru nara ya ego ndị ahụ na mpekere mpekere.

O kwuru na Samuel na-agwa ya wepụta ego ndị ha retere na kaadị ule n'ụlọakụ ya. n'okwu ya - "Ego m na-ewpụta, ọga m na-eji ya etinye n'ụlọọrụ, ụfọdụ oge o jiri ya maka onwe ya".

O kwukwara na ya adọọla oga aka na nti ọtụtụ oge maka ego ahụ ọ na-ewere mana ọ naghị anụ.

Ụfọdụ ego ahụ o wepụtara gunyere puku naịra 340 o wepụtara ụbọchị 5 na 24 ọnwa Mee afọ 2014 nakwa puku naịa 120 o wepụtara ụbọchị 17 na 18 ọnwa Juunu afọ 2014 wdgz.

Ndị EFCC ekwuola na ndị nyocha ha achọpụtala na akwụkwọ ego si n'ụlọakụ Chieshie gosipụtara ihe ndị o kwuru, nke kpatara ha jiri kpọbata ọga ya ịgba ya ajụjụọnụ.

Gịnị ka Umoru kwuru

Ụmoru agọnaghị ebubo a e boro ya mana ọ nara mgbapụta n'aka ndị uweojii ma na-agakwa n'ụlọọrụ ndị EFCC igosi onwe ya kwa ọnwa.

Mana ihe na-atụ n'anya bụ na ihe ndị a niile Chieshie kwuru apụtabula tupu akụkọ agwọ apụta.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara