Ndị Sineti akụpụla alo ka ụmụnwaanyị NYSC yiwe peteri

Ndị ji otu afọ efe Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Sineti kwuru na inye ohere 'onye yiri ihe masịrị ya' ga-ebute nsogbu n'ime ndị ji otu afọ efe Naijiria nke a kpọrọ NYSC n'aha ịchafụ

Ndị ọgbakọ omeiwu nke ukwu bụ Sineti kwuru na inye ohere 'onye yiri ihe masịrị ya' ga-ebute nsogbu n'ime ndị ji otu afọ efe Naijiria nke a kpọrọ NYSC n'aha ịchafụ.

Dịka Sinetọ Emmanuel Bwacha na-anọchite Taraba bụ onye tụtara alo a siri kwuo: "Ihe na-ebutekarị esemokwu n'iwu NYSC bụ iwu na ndị ji otu afọ efe ala nna anyị ga na-eyi traụza. Nke a megidere okpukperechi ụfọdụ ụmụnwaanyị. Imegharị ya bụ iwu ga-ebute nsogbu a na njedebe."

Mana Sinetọ Suleiman Adokwe na-anọchite Nasarawa kwuru na "nsogbu imegharị iwu ahụ ga-ebute ga-akarị ahụhụ a ga-ata imegharị ya."

Ebe Sinetọ Sam Egwu na-anochite Ebonyi kwuru "Anyị ekwesịghị ịna-egbu oge imegharị iwu anyị enweghị ike imegharị."

Akụkọ ga-amasị gị:

Na okwu ya, Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi Sineti ma bụrụkwa onye nọ n'isi oche mkparịtaụka nke ndị Sineti ụbọchị ahụ, kpọrọ oku ntuliaka nke okwu ọnụ ebe ndị jụrụ ka emegharị iwu ahụ karịrị ndị kwenyere.

Ekweremadu gara n'ihu kwuo: "Anaghị m agba mbọ ka m kwụsị alo ahụ. Ọ bụrụgodu na anyị tinye aka na ya, a ga-ezigaya na steeti niile ka ha tinye aka ha na ya dịka ịwuala anyị siri kwuo."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a