Atọhapụla onye ntaakụkọ ndị DSS ji ka abali asaa gara

Ndị uweoji Naịjirịa Image copyright Getty/AFP

Ngalaba nzuzo na-ahụ maka nchekwa nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ atọhapula Tony Ezimakor bụ onye ntaakụkọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ntaakụkọ Daily Independent.

Atọhapụrụ Ezimakor ka abalị asaa gara n'ihu ka ndị mmadụ na-enye ezigbo nsogbu ịhụ na gọọmentị tọhapụrụ ya.

Anwụchiri Ezimakor bụ onyeisi Daily Indpendent n'Abuja maka akụkọ ha dere banyere ụgwọ gọọmentị Naịjirịa kwụrụ iji hụ na Boko Haram tọhapụrụ ụmụ Chibok ha ji. A kpọrọ akụkọ ahụ ''Chibok Girls: How Swiss-Mediated Deal Revived Boko Haram''.

Akụkọ sị na ndị DSS gara n'ụlọ Ezimakor, buru ihe ole na ole wee pụọ.

Image copyright Daily Independent
Nkenke aha onyonyo DSS nwụchiri Tony Ezimakor n'ihi na ụlọakụkọ nke oso n'isi ya dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru maka ụmụagbọghọ Chibok

Ọ bụ abalị asaa ka ha ji onye ntaakụkọ a, mana ka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ikike onye-kwuo-uche ya kwanyere gọọmenti ọkụ n'ike, ha tọhapụrụ maazị a.

Ọ dị ka onwere ndi nọ n'ọchịchị ihe a Daily Independent dere na-ewe iwe, ọkachasị etu o siri pụta ka a ka nọ na-ekwu maka ụmụakwụkwọ atọọrọ na Dapchi, nke dị na Yobe steeti.

Ndị a ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ikike kwuru na ha ga-aga ngagharị iwe na Wednesday, bụ taa, ma ọ bụrụ na-atọhapụrụ nwoke a.

Oruola ndị ntaakụkọ 20 anwụchiri kamgbe 2015 Buhari rigoro n'oche ka onyeisiala Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara