Anambra: Obiano achụọla kọmishọna ruru 18

Obiano Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ

Gọọmenti Anambara steeti emela nchịgharị na ndị ime kọmishọna ha dịka aka na-achị ha bụ Willie Obiano chụrụ ndị kọmishọna mmadụ iri na asatọ taa.

N'akwụkwọ ozi onye ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Solo Chukwulobelu binyere aka, ọ nyere ndị niile nchịgharị a metụtara ka ha nyefe ihe niile ha kwesiri inyefe n'aka ndị isi ụlọọrụ ebe ha na-arụ.

Akwụkwọ ahụ kwukwara ka ha nyefe ụgbọala nakwa ọrụ niile ha ndị ọzọ bụ nke gọọmenti ha ji tupu ụbọchị 16 ọnwa Maachị afọ a bụ 2018.

Otu onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Obiano bụ Oliver Okpala kwuru na ihe Obiano mere dị mkpa iji bido ọchịchị ọhụrụ na steeti ahụ.

Cheta na Obiano meriri na ntuliaka ha mere we buru gọvanọ steeti ahụ nke ugboro abụọ.

Anyị ga na-ewetara gị akụkọ ka ọ na-abịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: