Obidigbo: A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha

Dọkita Chike Obidigbo
Nkenke aha onyonyo Dọkita Chike Obidigbo

Chike Obidigbo kwara arịrị na kemgbe ọchịchị nọ ugbua batara, onweghị ọkwa nwere isi onye Igbo ji na Abuja.

O kwuru na onye ọbụla na-asị ka Naijiria bụrụ otu kwesiri ibu ụzọ mee ka Ndigbo nweta oke ruru ha dịka ndị Awụsa na ndị Yoruba.

Obidigbo kwuru na ekwesịrị ịghagharị usoro ochịchị n'Naijiria ka ọghara inwe agbụrụ a na-emegbu emegbu.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ihe na-agba anya mmịrị na nanị ọdịda anyanwu bụ Igbo bụ ebe e nwere steeti ise, ebe ndị ọzọ ka n' ọnụọgụgụ.

Nke a mere na-abia n'ụlọ omebeiwu Ndigbo enweghị ọtụtụ ndị na-ekwuru ha ọnụ ha nke ha na- enwe ndị ga-enwetara ha oke ha ma atụliba aka n'ụlọ omebeiwu abụọ dị na Naijiria.

Obidigbo kwuru na ọ bụrụ na goomenti chọrọ ime ka obodo a dị mma, ha ga-eme Okeke ka ha mere Okafọ.

O nyere ọmụmaatụ site na ihe mere na Kano steeti, ebe INEC hapụrụ ụmụaka ha soro mee ntụlịaka.

Obidigbo nyere Goomenti ndụmọdụ ka yabụ ọgụ ha na-anụso mpụ na aghụghọ bụrụ eziokwu site na inyocha ụlọọrụ INEC na etu ha si arụ ọrụ ha.