'Anyị na-ejikọ aka maka mmepe obodo'-Gọvanọ South East

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụ na ụba bụ Boniface Chizea ekwuola na irụ ụzọ njikọ n'ọwụwa anyanwụ bụ ihe kwesiri ekwesi

O kwukwara na ọ bụ ihe akarị mego kamgbe,ekwesịghị ikuru ha aka maka nkpebi ọhurụ a.

Nsogbu enwere bụrụ na mbụ bụ na-enweghị ụzọ dimma ejị aba gasi steetị ndị a.

Chizea sị na ọ ga-enyere nzụkọrịta ahia n'etiti steeti ise dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ.

"Ọ ga-eweta nnukwu njikọ n'etiti ha."

Ihe bụkwa mkpa anyị bụ ma aga-emekwa ya bụ ihe ekwuru.

O kwukwara na n'agbanyeghị na Gọvanọ na-achị Anambra steeti abiaghị ya bụ nzụkọ,na ọ nweghị ihe mebiri nụ.

Ụfọdụ ọhọm Mazi Chizea na-ahụ na ya bụ nkpebi bụ ka aga-esi nweta ego wee ruọ ụzọ a makana steeti ọbụla nwere mkpa nke ha.

O buru go dị na-eweta ego,ọ dikpa i mata ka-aga esi were ya ruọ ụzo maka mmefusi.

Chizea kwukawara na ụgbua bụ oge iji nweta ihu onyeisiala bụ Buhari maka oge ntuliaka eruwe la makana o ga-ege ha nti.

Na mbụ anyị gwara ụnụ na otu jịkọtara ndị gọvanọ ise dị na ọwụwa anyanwụ ekwuola na ha ga-amalite ozugbo ịrụ ụzọ ruru 430 kilo mitas ga-ejikota Enugwu, Anambra, Ebonyi, Abia na Imo steeti.

Ndi Govano ise a bịakọrịtara n'Enugwu wee kwuo na ya bu okporo ụzọ ga-enyere aka ime njem site n'otu steeti baa n'ozo.

Ndi otu ọrụ ụfọdụ bịakwara kọwara ndị gọvanọ a ihe di iche iche gbasara ọdịmma ndị zone ọwụwa-anyanwu a.

Ha toro ụlọọrụ na-enye ọkụ bụ Aba Independent Power Project, wee gwa onye nwe ya bụ ọka mmụta Prof. Bart Nnaji ka odee ihe niile ọ gwara ha ka ha were ya nye ọchịchị onyeisiala bụ Buhari, iji hụ na ọkụ batara n'uju na mpaghara a.

Ndị Gọvanọ bịara ya bụ ọgbako ha jịrị wepụta nkwekorita ha nile gunyere Ifeanyi Ugwuanyi - Enugwu; Okezie Ikpeazu - Abia; Dave Umahi nke Ebonyi bu Onye isi otu ahụ. Onye osote Gọvanọ Imo bụ Eze Madumere nọchitere anya Gọvanọ Rochas Okorocha, ebe Anambra abiaghị na ya bụ nzukọ otu ubọchi.

Ndị Gọvanọ steeti ise ahụ nabatakwara atụmatụ ndị otu chọrọ igwu okwe lottery na southeast wetara wee kwuo na ha ga-eleba ya anya.

Ndi Gọvanọ ọwụwa anyanwụ ala anyị ahụ kelere ndị niile bụ ndị Enugwu, Anambra, Ebonyi, Imo na Abia ka ha sị wee jikọta aka ọnụ nye Chief Alex Ekwueme ugwu ikpeazu n'oge olili ya, ha kwuru na ụdị agwa idinaotu a bụ ihe ga-enyere ndị steeti ise a aka.

Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a