Emefiele: Nye ụmụnwaanyị ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ

Godwin Emefiele Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria

Emefiele kpọrọ oku a taa n'Abuja mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme iji cheta ụbọchị ụmụnwaanyị n'ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ.

O kwuru na ọnọdụ e nwere ụgbua ebe ọ bụ sọọsọ mmadụ atọ n'ime mmadụ iri abụọ na asaa bụ ndị isi ụlọ akụ na Najiria adịghị mma.

O kwuru na CBN enyewanyela ụmụnwaanyị ohere ịnọ na nnụkwụ ọkwa gbagoro sitere na otu nwaanyi ibụ diretọ n'afọ 2001 gbalie ga ụmụnwaanyị isii n'afọ 2017 ebe pacent ụmụnwanyi CBN were n'ọrụ gbaro site na pacent iri abụọ na anọ ga iri abụọ abụọ na asatọ.

O kwuru na CBN mara mkpa ụmụnwaanyị dị n' ịnọ na nnukwu ọkwa nke mere ka ha nwe atụmatụ iji kwalite ha.

"Dika a matara na ụmụnwoke kachasị nọrọ na nnukwu ọkwa n'ọrụ ụlọakụ, the kọmịti na-ahụ maka ọrụ ụlọakụ nke a kpọrọ bankers' Committee n'aha bekee, ewpụtala quota ga-enye ụmụnwaanyị pacent iri atọ."

Emefiele kwuru na ọ dịkwa mkpa ka ụmụnwaanyị na-esonye n'ihe a na-eme ọnọdụ dị mkpa na ọrụ na-abụghị nke gọọmenti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: