World Cup ga-ekene ndị ọrụ BBC na Lagos

Ndị na-eso egwuregwu bọọlụ ga-enwe ohere ị hụ ịko a na ndụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị na-eso egwuregwu bọọlụ ga-enwe ohere ị hụ ịko a na ndụ

Dịka iko a sị eme njem, o rutela na Lagos bụ isi obodo ochie Naijiria.

Iko nke a e ji ọlaedo were rụpụta ga-abia njem n'ụlọọrụ BBC dị na Lagos n'ehihe tata ka ọ kụrụ Elekere Atọ(3:00pm) tupu e buru ya ga Teslim Balogun Stadium dị na Surulere, Lagos.

Chebiri anyi na BBC News Igbo peeg maka Facebook Live dịka anyị ga-egosi gị ka o si aga.

A ga kwa e nwe mmemme a ga-emere ya n'ụlọoriri bụ Eko Hotels, ebe a ga-enye kwa ndị mmadụ ritere ya ohere ịhụ ịkọ na ndụ n'ụtụtụ ụbọchị Satọday na mbara Tafawa Balewa.

Iko FIFA a kwadoro ịga njem mba ruru iri ise na otu ndị tozuru ịga asọmpị ya a ga-eme n'afọ a na Russia.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Naịjiria so na mba ndị tozuru ịgba asọmpị iko mba ụwa n'afọ a

Chetanụ na iko a batara Naịjiria ụbọchị Wenesde ma kenekwa onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ọ ga-ahụpa Naịjiria na mgbede Satọde, ebe a ga-ebughachi ya Russia n'ọnwa Julaị.

Nke a ga-eme ugboro anọ ọ na-aga njem ụwa ma ugboro atọ ọ na-abịakwa ala Naịjiria.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a