Ondo Steeti: Anyị na-achọ dinta gburu enyi

Enyi Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Enyi so anụmanụ a na-achọ achọ n'ụwa niile

Gọọmenti Ondo steeti ekwuola na ha na-achọ otu dinta a kpọrọ Ọjaja onye gbagburu enyi n'ohia dị na Idanre, Ondo steeti.

Akụkọ kwuru na ọha obodo gbakọrọ ikiri anụmanụ dị ụkọ ebe ọ tọgbọ n'ozu mana ka ndị nta na ndị obodo ya na-ana ya aka nọ o bu dimkpa, ndị mara ihe a na-ekwu n'obodo kwuru na ihe o mere jọgburu udele, sigbuo nkapị.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe nwoke ahụ mere n'igwe okwu, Twitter.

Onyeisi ngalaba n'ahụ maka ichekwa anụmanụ nke a kpọrọ Nigeria Conservation Foundation na bekee bụ Joseph Onoja kwuru na ihe dinta ahụ mere bụ ihe mwute.

"Ọ bụ ihe mwute n'ihi na enyi ahụ sọ na enyi ohịa ole ma ole fọrọ n' Ọdida-Anyanwụ Naijiria."

"Ihe ọ mere bụ ihe megidere iwu nke ọ kwesiri inwe ntaramahụhụ iji kwusụsị ụdị ihe ime ọzọ."

Gee ihe Joseph Onoja kwuru n'uju na bekee:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDinta ahụ kwesiri ịta ahụhụ-Onyeisi NCF

Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọnatarachi nke a kpọrọ 'Natural resources' na bekee n' Ọndọ na steeti bụ Rasheed Badmus tụrụ arịrị maka ihe mere ma kwuo na gọọmentị na-achọ nwoke ahụ iji taa ya ahụhụ ya.

"Ihe mere na Idanre. Anyi amatabeghị ebe ọ mere kpọmkwem. Anyi akpọkọtala ndị ọrụ nchekwa na ndị dịnta ka ha nye aka chọta nwoke ahụ.

A ga-ata ya ahụhụ n'ihi na ihe o mere bụ ihe iwu mabidoro."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC na n'ezie na ya bụ ihe mere.

O kwukwara na ha ji foto nwoke ahụ na-achọ ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

N'ala Naijiria, dịka ọmenaala ọtụtụ siri dị, a na-ahụta onye gbụrụ enyị dịka dike.

Mana otu onye na-agba mbọ maka nchekwa ikike dịrị anụmanụ bụ Desmond Majekodunmi kwara BBC na omenaala ahụ ewuchala, na 'ọ dịghị mma.'

Majekodunmi kwuru na omenaala ochie na ndụ agba ọhụrụ dị iche ma rịọ ka gọọmenti gbalịa ikuziri ndị mmadụ mkpa ọ dị ichekwa anụmanụ ndị nwere ike mkpochapụ.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a