Ndị uweojii Enugwu anwụchiela nwoke gburu nwunye ya

Onye a kụrụ ịga Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya

Otu nwoke a kpọrọ Sunday Nnamani akụgbuola nwunye ya, n'Enugwu, Enugwu steeti.

Akụkọ kwuru sị na izụụka gara aga, Nnamani na nwunye ya bụ Nkechi nwere nghọtahie ebe ọ nọ kunye ya ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma.

E bugara ya n'ụlọọgwụ Parklane Specialist Hospital, Enugu, ebe ọ nọrọ na-enwe nleta tupu ọ nwụọ ụnyaahụ.

Mgbe BBC gbara ya ajụjụọnụ n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ SP Ebere Amaraizu, kwuru n'ezie na ọ bụ ihe mere eme.

"Ọ bụ eziokwu. Mana ọ bụ izuụka gara aga ka nwoke ahụ na nwunye ya nwere okwu o were ihe kụọ ya n'isi. E buga ya ụlọọgwu ma ọ nwụrụ ụnyaahụ."

Amaraizu gara n'ihu kwuo na aka ndị uweojii Enugwu steeti akparala nwaamadi ahụ, ebe o sokwa enyere ha aka na nyocha ha na-eme maka ọdachi ahụ.

Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu.