Ihe mberede Okporo ụzọ eriela ndụ mmadụ atọ na Lagos

Ụgbọala ahụ nke ọkwụọtọ kụrụ Image copyright @rrslagos
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru mmadụ iri merụrụ ahụ tụpụ atọ anwụọ

Mberede okporo ụzọ mere na Lekki taa eriela isi mmadu atọ ma merụo ndị ọzọ ahụ.

Akụko si ebe ihe mere na-apụta na-akọwa na ihe mere na ebe a na-atụ ụgwọ isi ụgbọala a na-akpọ "toll gate" n'olu Bekee.

Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na otu ụgbọala nke a na-akpọ "Jeep" kụrụ ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ were merụọ ihe rụrụ mmadụ iri ahụ.

Ndị ụlọọrụ ebe "toll gate" ahụ kwuru na "jeep" ahụ na-agba n'ụzọ o kwesighi mgbe ọ kụrụ ụbọala nke ọzọ ahụ.

E buru ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị ịcheịche na Gbagada ma na Marina dị nso ebe ahụ

Lee ihe onyonyo mmadụ nọ ebe ahụ setere:

Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ na Marina kwuru na otu onye nwuru ebe mmadụ abụọ ndị nọ gbagada nwụrụ.

Ndịọzọ ruru mmadụ asaa na-alụ ọgụ ndụ na ọnwụ n'ụlọọgwụ Marina ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a