2019:Ndị Igbo akwadoghị Buhari

Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala.

Ụfọdụ ndị ndu n'ala Igbo akatọọla akụkọ sịrị na ọ bụ ma Onyeisiala Mohammadu Buhari o were ọchịchị n'afọ 2019 ga-eme ka onye Igbo nwe ike ịchị n'afọ 2023 kwuo na ọ bụ okwu ọnụ ụtọ.

Onyeisi otu pati United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie gwara BBC Igbo na mkpebi a abụghị maka otu pati, na ọ bụ dịka ụmụ afọ Igbo ha bụ.

O kwuru na onweghị etu pati na-ama ọchịchị aka n'ihu ga-eji hapụ otu nke ya bịa na-akwado ọchịchị ọ na-ama aka n'ihu.

Okorie kwuru na ọ na-ekwuputa uche nke ya, mana ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-ekwu otu ihe ahụ, ọ pụtara otu ihe a metụtara onye ọbụla dịka ndị Igbo.

Gee ihe Chekwas Okorie kwuru ebe a;

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChekwas okorie: Agaghị m akwado onye otu ọzọ

Ndị ndu n'ala Igbo ndị ọzọ katọrọ atụmatụ ahụ gunyere; onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ ABC Nwosu, onyeisi ọhanaeze ndị Igbo n'oge gara aga bụ Dọkịta Dozie Ikedife, onyeisi ndị Sịnetị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Enyinnaya Abaribe nakwa onyeisi ndị Eastern Consultative Forum(ECA) bụ Elliot Ugochukwu-Uko.

Cheta n'oge gara aga, otu onye na-agbasa ozi maka onyeisiala na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Osita Okechukwu kwuru na Buhari bụ otu ụzọ pụtara ihe ndị Igbo ga-eji nweta ọchịchị onyeisiala.

O kwuru na Buhari e merela ndị Igbo oke ihe kwesiri iji rita mkpụrụobi ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a