Gọọmenti Syria nọ n'ụzọ mmeri n'ọwụwa anyanwu Ghouta

Ndị agha Syria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Syria na-achọ ka ha merie ndi ekweghịekwe na-ebuso ha agha

Ndị agha Syria ekebiela ọwụwa anyanwu Ghouta bụ ebe ndị agha ndị na-ekweghịekwe na Syria nọ ụzọ atọ.

Ndị agha gbara obodo Douma, bụ obodo kachasi na Eastern Ghouta okirikiri ma kebie obodo ọzọ na mpaghara ahụ.

Mwakpo ndị agha Syria mere n'ọwụwa anyanwu Ghouta kewara obodo ahụ ụzọ atọ ugbua.

Gọọment Syria bidoro ibuso ndi ekweghiekwe n'ọwụwa anyanwu Ghouta agha n'ọnwa Febụwari nke afọ a.

Mwakpo ha na eme dị ha mkpa maka na ha sị na ndị ekweghiekwe na Syria si ebe ahụ agbapụ ogbunigwe jee Damaskọs, bụ ebe nọ gọọmenti n'aka.

Otu ndị na elebanye anya n'ihe na-eme na Syria bụ ndị a na-akpọ "Syrian Observatory for Human Rights" (SOHR) sị na ndi agha gọọment Syria jizi ihe ruru ọkara mpaghara ọwụwa anyanwu Ghouta kamgbe ha malitere mwakpo ebe ahụ.

Ndị United Nations ekwuola na ha ekweteghị maka ogbunigwe gọọmenti Syria na-atụ ga ọwụwa anyanwu Ghouta, maka ha sị na ọ bụ ita ndị bi ebe ahu ahụhụ.

A na-ebo ndị agha Syria ebubo na ha na egbu ndị nkiti na mwakpo ha na-eme, mana ha si na ihe he na-eme bu izọpụta mpaghara ahụ, bụ ebe fọrọ na ndị ekweghiekwe ji na Syria.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: