Agbapụtala ndị Naịjirịa 50 sị Libya aga Italy na mmiri

Ndị mbịmbịa nọ n'elu mmiri Image copyright MSF/Twitter
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti naịjirịa kpọlatara ọtụtụ ndị Naịjịrịa a na-ata ahụhụ na Libya n'ọnwa Jenuwarị

Ihe ruru mmadụ iri ise ka a gbapụtara na orimiri Mediterranean ụbọchị Satọde dịka ha na-achọ ibanye mba Itali dị Libya.

Ndị nyere ha aka bụ ndị nchekwa nọ n'akụkụ mmiri na Libya, ndị ọrụ enyemaka na ndị dọkịnta na-akpagharị akpagharị a kpọrọ Doctors (MSF) without Boarders na aha bekee.

Ndị Naịjirịa ahụ nọ n'elu ụgbọ mmiri gunyere ndị mbịmbịa mmadụ otu narị na iri ndị ọzọ oge a gbapụara ha.

Ndị isi obodo ahụ kwuru n'ụgbọ ahụ ekpuchala na mmiri tupu ha erute ebe ha nọ.

Dịka ndị MSF siri dee n'akara ha na twitter, ha kwuru na ebe obi kopụrụ ụfọdụ nime ha, onweghi onye meruru ahụ dịka ha gbapụtasịrị ha niile.

A ghara ndị Naịjirịọ́ sọ na ndị ahụ, ndị ọzọ si obodo ndị dị na mpaghara Afrịka ndị ọzọ.

MSF ga-akpọ ha gaa ItalI dịka ha na-ekwu na ụgbọ mmiri ha ga-anọ na-agbapụta ndụ mmadụ ma nyere ha aka.

Mana ndị ọrụ nchekwa Libya jidere, ha na-akpọghachi ha Libya maka na otu EU nyere ha ikike ịkwụsị ndị mbịambịa ibanye mba dị na Europe.

Libya bụ isi obodo ndị mbịmbịa na-esi abanye Europe.

Ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ anwụọla n'ụzọ nakwa n'elu mmiri Mediterranean dịka ha na-achọ ịga Europe.

Gọọmeti Naịjirịa na gọọmenti ndị ọzọ dị n'Afịrịka ebidola mgbasaozi iji kpọlata ndị tọrọ atọ na mba Libya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: