Frank Wolf sị na oge erụola mgbe a ga-etinye anya na Boko Haram

Frank Wolf na America Image copyright Aaron P. Bernstein
Nkenke aha onyonyo Frank Wolf kwuru n'ihe karịrị mmadụ 30,000 gbara ọsọ ndụ si Naịjirịa gbafee Europe n'afọ 2016

Mgbe mbụ ndị mba Amerika na-etinye anya na mkpamkpa ndị ọmekataraihepuujọ na-akpa na Naịjirịa bụ n'onwa nke anọ (April) 2014.

Mgbe ahụ ka chi jiri n'ehihie n'anya ụmụakwụkwọ 276 ndị ọjọọ tọọrọ na Chibok, nke ọtụtụ n'ime ha bụ otu Kristi.

Nke a mere ka mba niile bido kwuwe maka ha.

Ụzọ mgbasaozi soshal midia nwuru ọkụ maka akụkọ gbasara ụmụaka ahụ.

Mgbe ahụ ka e bidoro nụwa maka "BringBackOur Girls".

Image copyright STRINGER
Nkenke aha onyonyo Ndị otu "BringBackOurGirls" che na ha emeriela rụọ mgbe atọọrọ mmadụ 110 na Dapchị

Ndị niile ọnụ na-erụ n'okwu n'uwa dika nwunye onyeisiala mba Amerika mgbe ahụ bụ Michelle Obama bidoro bugheriwe akwụkwọ e biri "BringBackOur Girls".

Ndị ọrụ na-eme ihe ejije na Hollywood batakwara na ya mgbe ahụ.

Dịka nta akụkọ kwuru na-mgbe a na-eme ihe a, ọtutụ a chọpụtabeghị mmekpe ahụ dịrị ndị otu Kristi na Naịjirịa, ọkachasị ndị bị n'ugwuawusa ya na mkpa Naịjịrịa dị na mba Afrịka.

Ka nke a mechere, akụkọ ndị ọzọ maka arụrụala ndị ọmekataraihepụụjọ na arụsa ndị otu Kristi, ya na ka ndụ ha siri bere ebere na-aka ndị ọjọọ na Naịjirịa bidoro batawa ndị mba ofesi ntị.

Akwụkwọ akụkọ Eurasia Review dere na otu onye otu Kristi bi n'Ugwuawusa dere akwụkwọ ozi si na "ugbua bụ oge ọnwụnwa dịrị ndị otu Kristi, ọ kachasị ndị bị na Ugwuawusa".

Ọ bụrụ na atọghị ụmụ ha na Chibok, ọbụrụ na Dapchi ebe ndị ọjọọ kpatara ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110.

Ma nke a emeghị, ọbụrụ na a na-atọgharị ụmụaka ha na-ike ka ha fewe chi ndị alakuba ma mee ka ha luwa ndị otu ha dịka ha mere na Kaduna Steeti.

Ma ọ bụ e gbuo ha ka ọkụkọ n'aka ndị na chị ehị dika ọ dị na Benue Steeti ebe egburu mmadụ dị 73 na obodo ha.

Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na-agbanyeghị na ndị otu Kristi ekweghịekwe, mana "ha chọrọ enye m aka nkwankwa".

Ọ sịkwa na-onwebeghị ezigbo ihe ndị gọọmenti Naịjirịa megoro ihụ na e bere ya hụ ogbugbu a an egbu ndị otu Krisiti.

Ndị agha Naịjirịa na e kwukwa na e memiela ndị Boko Haram.

N'izu gara aga, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na Plateu Steeti na ya a dịla njikere ị kwusị ọgụ niile na-ada na Naịjiria.

N'aka nke ọzọ, onye ọmeiwu n'ụlọnta ọmeiwu nke mba Amerika na-anọchitebụ anya ndị Virginia bụrụkwa onye na-kwuchitere ndị enweghị ka ọ ha ha bụ Frank Wolf kwuru ihe anya ya hụrụ mgbe ya gara Naịjirịa n'afọ gara aga.

Ọ kwuru na oge eruola mgbe ndị mba ụwa ga a kwanye gọọmenti Naịjiria ọkụ n'ike ka ha gbaa mbọ kwụsị arụrụala niile ndị Boko Haram nakwan nke ndị na achị ehi na-arusa ndị mmadụ n'obodo ahụ.

Okwuru na Naịjiria bụ mba kachasị ọnụọgụ na Afrịka.

Ya kpatara na ịhe ọbụla metutara Naịjirịa ga-emetu mba uwa, maka n'anya bewe, imi ebewe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a