Onyeara egbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Ogun steeti

Otu onye nwere isi mgbaka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa enweghị otụtụ ụlọogwụ na-agwọ ndị nwere ọrịa isi mgbaka

Ilu Igbo kwuru na ndị ọrụaka ụgbọala (mekanik) ekweghị mmadụ mara onye isi dị nma na onye isi mebiri emebi.

Ilu nke a na-abia ka otu onyeara akpọrọ Lekan Adebisi gara n'otu ụlọakwụkwọ akpọrọ St John's Anglican Primary School Agodo dị n'Ogun steeti gbuo ụmụakwụkwọ abụọ.

Aha ụmụaka abụọ ahụ bụ Mubarak Kalesowo na Sunday Obituyi.

Ha abuọ dị afọ anọ, nọcha na klasị ọtaakara.

Akụkọ kwuru na onyeara a batara n'ụlọakwụkwọ a mgbe ụmụaka na-aga egwuregwu, wee kpaa mkpamkpa a.

Ugbua, onweghị onye mara ebe Adebisi nọ maka na ọ gbara ọsọ oge ọ magburu ụmụakwụkwọ a.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ndị uweojii na-achọ ya achọ n'ebe niile ugbua.

O kwukwara na ndị uweojii agaala n'ụlọakwụkwọ ihe mberede a mere maka ime ka udo laghachịta.

Gịnị ka ha ga-eme Adebisi?

Ihe kachasị ndị uweojii mkpa ugbua bụ ijide ya n'aka.

Oyeyemi kwuru na ndị uweojii anaghị akpọ Adebisi 'ogbummadu' ugbua maka na ha ka na-achọ ịchọpụta ihe mere o jiri kpaa mkpamkpa a n'isi mbido.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a