Abuja - Ụlọikpe akwụsịla NASS ịhazigharị usoro ndọrọndọrọ ọchịchị

NASS na Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Accord Party gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka NASS ghara ịmegharị usoro ejị eme ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa

Ụnyahụ bụ Wenezde, Nkwọ, ka ụlọikpe ukwu nọ n'Abụja kwụsịrị ndị omeiwu NASS ka ha aghara ịme ihe ọbụla maka ịmegharị iwu nke usoro ndọrọndọro ọchịchị na Naịjirịa bekee kpọrọ "Electoral Act".

Cheta na Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari jụrụ na ya agaghị etinye aka na ya bụ akwụkwọ nke ndị ọgbakọ ọmeiwu wetere ya rụọ mgbe ụlọikpe ahụ kpebi ikpe maka akwụkwọ Accord Party gbara ha.

Ọkaikpe ukwu na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Ahmed Mohammed gwara ndị ya bụ ikpe metụtara ka ha ghara ịtinye aka maọbụ mee ihe ọbụla na ya bụ okwu "rụọ mgbe ụlọikpe ahụ yiri agba maka ya bụ ikpe".

Mohammed rụtụrụaka n'akwụkwọ ikpe obodo Naịjirịa, Isi nke isii 6 (6) nke 1999 Kọnstitushọn bụ ebe nyere ụlọikpe ikike ịkpụchị okwu ọbụla ewebetere na ya.

Eyighariri ikpe ahụ ruo Tuzde, Orie 20 Maachị.

Ụlọikpe ahụ sị na ha ma na ndị NASS nwere ike ịmalite ịmewe ebụm n'obị ha site na-ịdọrọ ike site na-ikike nke akwụkwọ iwụ bụ kọnstitụshọn, isi nke iri na asatọ amọokwụ nke ise 58 (5) nyere ha.

Akwụkwọ iwu a nyere ndị NASS ikike ịkpọkọta ndị otu ha ruru okara abụọ n'ime atọ bụ ndị kwekọrịtara na ya bụ atụmatụ. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọjụjụ ọnyeisiala jụrụ na ya agaghị etinye aka n'akwụkwọ agaghị enwekwa isi.

Ihe bidoro ikpe a bụ arịrịọ ọnụ efụ ndị otu Accord Party rịọrọ ụlọikpe sị ha ekwela ka ndị NASS mee uche ha na ya bụ okwu.

N'aka nke ọzọ, ọkaikpe ndị NASS bụ Nwaada C.E. Ogbozor kwụrụ na udị arịrịọ a Acord party an-arịọ abụghị ihe ejị ọnụ efu arịọ.

Na-ọbụrụ an ụlọikpe kweta ya na nke ahụ bụ ịnapụ ndị NASS ikike dịrị ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: