Buhari: Gịnị mere i jiri gbahapụ Benue Steeti?

Ibrahim Idris were ọchịchị onyeisi ndị Uweojii n'ọnwa Maachị afọ 2016 Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ibrahim Idris were ọchịchị onyeisi ndị Uweojii n'ọnwa Maachị afọ 2016

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari gwara onyeisi ndị Uweojii bụ Ibrahim Idris ka ọ wuchie n'isi ọchịchị dị na Abuja, bịa kọwa ihe mere oji gbahapụ Benue Steeti.

Mgbe Idris wuchiri n'Aso Villa ụnyaahụ, Onyeisiala gbara ya ajụjụ ihe mere o ji nupuisi n'iwu o nyere ya ka ọ kwakọrọ ngwongwo ya laa Benue Steeti.

Oge mkparịta ụka ha nọrọ nkeji iri atọ, ebe onyeisiala na-abatara ya n'ime ụlọ n'onweghi onyeọzọ nọọ ya.

Onyeisi ndị Uweojii hapụrụ isi ọchịchị bụ Aso Villa na-atụpụrụghị onye ọ bụla ọnụ oge mkparịta ụka ha gụrụ.

Onye enyemaka pụrụiche na mgbasa ozi nke ọnyeisiala bụ Garba Shehu kwuputara na mkparịta ụka ahụ bụ eziokwu.

Shehu jụkwara ịkọwa ihe bụ isiokwu ụka ha, kwuo na ọ ka onyeisi ndị Uweojii kọwa ọrụ ya iji gbochie ọgbaghara dị na Benue Steeti.

Cheta na mgbe onyeisiala mgbe ọ gara Benue kwuru na ọ bụ ihe iju anya nye ya na Idris anọghị na Benue Steeti dịka ọ nyere ya n'iwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a