Innoson azaghị oku ụlọịkpe 'Special Offences' kpọrọ ya.

Innoson na-arụpụta ụgbọala dị ịcheịche Image copyright Innsonmotors.com
Nkenke aha onyonyo Onye ọkaịkpe ji okwu ekwuola na ọ wepụla aka ya n'ihe gbasara okwu a

Onyeisi ndị ọrụ Innoson Motors bụ Innocent Chukwuma abịaghị ụlọịkpe puruiche akpọrọ Special Offences Court na bekee taa na Ikeja, Lagos steetị.

A kara na a ga ebido ị kpe ịkpe di n'etiti ya na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara nrụrụaka ego bụ EFCC taa mana ọ pụtaghị

Nke a ga-eme ya ugboro atọ Chukwuma nwe Innoson ga-agbachi nkịtị ebe ụlọịkpe na-akpọ ya.

Mana Innoson gbara onye okaiwu ji ịkpe ya bụ Jọstis Mojisola Dada akwụkwọ ya sere aka n'ihe gbasara ịkpe ya.

Okaịkpe Dada kwuru na ebe Chukwuma kpere ya na aka ndị National Judicial Komision, ọ gaghị eme ihe ọzọ n'ịkpe Innoson rue mgbe ọ zara ndị Kọmishọn ajụjụ .

Ụlọịkpa a kpọla Innoson na Jenụwarị 17 n'akwa na Ferbụrụwarị 9 mana ọ zaghị ma kwuo ihe ojighi za.

Ihe meburu ochie n'okwu a:

Image copyright Innosonmotors.com
Nkenke aha onyonyo Innoson na-arụpụta ụgbọala dị ịcheịche
  • 19 Dizemba -Ndị EFCC gara n'ụlọ Innoson Chukwuma jiri ihe ike kpụrụ ya pụọ.
  • 20 Dizemba - EFCC si Enugwu kpụga Innoson na ụlọọrụ ha dị na Lagos ma bo ya ebụbọ nrụrụaka ego.
  • 21 Dizemba - EFCC hapụrụ ya sị ya la wa mana ọ jụrụ sị n'odoghị ya anya ihe ha ji nwuchie ya mbụ.
  • 17 Jenụwarị - Innoson kwesiri ị pụta n'ụlọịkpe kwuchite ọnụ ya mana ọ gaghị.
  • 9 Ferburuwarị - Ụbọchị ọzọ ndị ụlọịkpe kpọrọ Innoson oku mana ọ zaghị kama ọgba onye ọkaikpe Mojisola Dada akwụkwọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a