'Anyị na-achọ ụmụụnụ'- Buhari

Mohammadu Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram?

Onyeisiala Mohammadu Buhari agwaala ndị Yobe steeti na ihe emere ojiri ga steeti ha bụ maka ị gwa ndị nne na nna ndị agha iyiegwu tọọrọ umu ha ndo.

Buhari kwuru na kemgbe ihe a mere, ha na-agba mbọ ị hụ na achọtara ndị ụmụakụkwọ a sị ụlọakwụkwọ akpọrọ Government Girls Science and Technical College na bekee n'ime Dapchi, Yobe steeti.

O kwukwara na ọ nyeela onyeisi ndị uweojii na ndị isi otu nche di ịcheịche iwu ị me ihe niile ha nwereike ị me maka ịzọpụta ụmụawụkwọ a.

Buhari kwuru na "ndị agha ala anyi na-achọ ụmụakwụkwọ a n'ime ọhịa dị na mpaghara ugwu Naịjirịa"

O kwukwara na ndị aghaelu na-enyocha yabụ ala, na gwa kwa ndị nne na nna ndị ha tọọrọ ihe niile ha mara gbasara ịzọpụta ha.

Buhuri kwere ha nkwa na kọmitee iri na abụọ ebidoola ọrụ maka ihe nzọputa ụmụakwụkwọ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a