Gọọmentị Enugu ebidola ị rụzi ahịa Timbershade gbara ọkụ

ụlọ ahia dị iri asaa na abụọ nke gbara ọkụ
Nkenke aha onyonyo Ebidola ọrụ n'ụlọ ahia dị iri asaa na abụọ nke gbara ọkụ

Ahịa osisi dị na Timbershade Enugwu nke gbara ọkụ ụbọchị ole na ole gara aga, abụrụla nke ọrụ mgbanwe malitere na ya na ike na ike.

BBC Igbo gara na ya bu ọgbọ ahia wee hụ na ofoziri ntakịrị ka a ruchaa ya bu ụlọ ahia dị iri asaa na abụọ nke gbara ọkụ pia pia.

Onye isi otu jịkọtara ndị ahịa Timbershade bu Levi Obi, kwuru na ọchịchị ya ga-eji ego ahụ dị nde naira iri na anọ na ụma, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nyere ha wee rụzisia ya bụ ahia.

O kwere nkwa na o nweghi onye ọ bụla a ga-emegbu na ya bụ ọrụ.

Nkenke aha onyonyo Onye ode akwụkwọ ndị Timbershade Gilbert Nnaji onye ụlọ ahịa ya gbara ọkụ na-ekele gọọmentị Enugu

Friday Egbo na Moses Nwangwu kwuru na ha nwere olileanya na gọọmenti ga enye ndị Timbershade igwe na enye ọkụ transformer nke ha, ya na ụgbọala na agbanyụ ọkụ ka ewee chekwaa ọdachia na ọdinihu.

Levi Obi kwukwara na gọvanọ Ugwuanyi kwekwara onye ọ bụla ụlọ ahịa ya gbara ọkụ nkwa ị nye ha niile otu nari puku naira na otu otu ka ha were kwanye ngwa ahịa.

Ọrụ na-aga ọsọsọ na ya bụ Timbershade, nke na oge na adịghị anya ahịa ga amalite n'uju.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a