Lagos: Katakata na-ada n'Ọjọta dị na Lagos

Ọdọ ụgbọala Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị na-eme njem na-aga Ojota ịbanye ụgbọala na-aga ebe dị icheiche

A na-atụ ụjọ na o nwere ndị nwụrụ dịka ọgbaghara bidoro n'Ojota ụnyaahụ ebe ndị ntorobịa abụọ nwere nghọtahie ma bido ịlụ ọgụ.

Akụkọ kwuru na itu onye nime ha nke a na-akpọghị aha ya tiri nwanne ya ihe maka ya bụ nghọtahie.

E kwuru na ndị ntorobịa ndị ọzọ tinyere aka ịlụsọ onye tiri nwanne ha ihe nke butere ọgbaghara ahụ jiri nwuru ọkụ pụta n'ụtụtụ taa.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Legos steeti e kwuola na ọgbaghara ahụ mere ma kwuo na ndị uweojii awụchiela ebe ahụ.

E kwuru na ọtụtụ ọgbatumtum ka e mebiri n'ọgbaghara ahụ.

Anyị ga-ewetara gị akụkọ ka ọ na-abịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: