Enugwu na-akpọtu maka njem nleta Fayose bịara

Gọvanọ na-achị Enugu state Ifeanyị Ugwuanyị Image copyright Enugu state Government
Nkenke aha onyonyo 'Gburugburu' ka a na-etu ya gosiri Fayose ọtụtụ ebe n'Enugwu

Ayo Fayose bụ Gọvanọ na-achị Ekiti steetị gara ụnyaahụ ịleta Gọvanọ ibe ya bụ Ifeannyi Ugwuanyị nke na-achị Enugu.

Akụkọ kwuru na Ugwuanyi nabatakwa ya Fayose mgbe ya na ndị so ya rutere Enugwu.

Ka ha nwechara mkpakọrịta, ha malitere gagharịba na gburugburu Enugwu ebe ndị nso Ugwuanyị na-etu ya aha na-akpọ ya 'gburugburu'

Gọvanọ Fayose kwụsịrị n'otu ahịa zụta karọtụ ma rịọ kwa mmiri ọ ga-eji sacha ya.

Lee ihe mere ebe ahụ n'ime ihe onyonyo a:

Akụkọ ga amasị gị: