Onyeisiala mba Mauritius Gurib-Fakim ga-arịtu - onye ọkaiwu

Ameenah Gurib-Fakim Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ameenah Gurib-Fakim bụrụ nwaanyị mbụ ahọpụtara dịka onyeisiala n'afọ 2015

Naanị nwaanyị onyeisiala mba Afịrịka nwere bụ onyeisiala mba Mauritius Ameenah Gurib-Fakim edela akwụkwọ arụkwaghị m dịka ọ ga-akwụsị ọrụ ụbọchị Fraidee abalị iri abụọ na atọ ọnwa a bụ Maachị.

Gurib-Fakim nọ na nsogbu gbasara etu osiri mefuo ego.

Ọ gọnarịrị ime ihe ọjọ ọbụla dịka a na-atụ ya aka na o mefuru ego n'onwe ya site n'ụlọakụ ndị a na-enyere aka.

Mana taa, naanị ụbọchị ole na ole ka o kwuchara na ya agaghị arịtụ, onye ọkaiwu ya bụ Yusuf Mohamed gwara ndị ntaakụkọ na ọ ga-arịtụ.

Onyeisiala ahụ ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a.

O kwuburu na ya ga-arịtụ ụbọchị Mọnde 12 Maachị mana oge ọ na-arịtughi, ụjọ tụwara ndị mmadụ na e nwere ike inwe tiguo zọgbuo na mba ahụ.

Otu akwụkwọ mgbasaozi L'Express buru akụkọ n'ọwa Feburuwarị na onyeisiala ahụ jiri kaadị ndị Planet Earth Institute nyere ya wee zụọ akwa na ọla ndị ọzọ.

Akwụkwọ ahụ kwuru na e nyere ya kaadị ahụ maka na ọ bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ iji kwụọ ụgwọ ọtụ ọrụ enyemaka ha rụrụ n'aha onyeisiala ahụ.

Mana Gurib-Fakim kwuru na ya nwere ụdị kaadị ahụ sitere n'ọtụ ụlọakụ ahụ.

O kwuru na eweghachiela ihe ruru puku dola iri abụọ na asaa n'ụlọakụ ndị ụlọọrụ ahụ dịka ndị ụlọọrụ PEI gwara BBC.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: