'Ndị Boko Haram egbuola ndị ọkụ azụ 5 na Lake Chad

Ndị agha Chad Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị agha si Chad, Naịjirịa na Cameroon na-ebuso ndị Boko Haram agha

Akụkọ na pụta site ụwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa na ekwu na ndị omokome a na-eche na ha bu ndị Boko Haram egbuola mmadụ ise bụ ndị na-akụ azụ na Lake Chad.

Ihe a mere na ime obodo dị na Lake Chad.

Onyendu ndị na-akọ azu na Borno Steeti bụ Abubakar Gamandi siri na egburu ndị a maka ha na enyere ndị agha Naịjiria aka n'ịchọ ụmụakwụkwọ a nwụchịrị na Dapchi na ọnwa gara aga.

Mwakpo a ejiri gbuo ndị a mere na ala miri gara okirikiri a na-akpọ Tudun Umbrella n'ime Lake Chad, bụ ebe Naịjirịa, Chad na Cameroon nwere ụsọ.

Onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari sị na ya na-agba oke mbọ ka a hụ na ụmụakwụkwọ a ndị Boko Haram tọọrọ laghachitere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a