'Ndị ọchị ehi egbuola nwata akwụkwọ na mmadụ 4 ọzọ' na Edo

Onye Fulani na ehi ya Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị a na-ekwu na-akpa ike dị icheiche

Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi egbuola mmadụ ise na ọchịchị ime obodo Ojierakhi nke dị na Ugboha, n'ọchịchị ime obodo ndịda ọwụwa anyanwụ Esan n'Edo Steeti.

Mkpam kpa a metụtakwara ndị obodo Odiguetue nke dị na ọchịchị ime obodo ọwụwa anyanwụ ugwu Ovia na steeti ahụ.

Mmadụ 12 merụrụ ahụ na mwakpọ a, nọ n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Ihe a mere na Ugboha n'abalị Fraịdee dịka ojiri 'ọkara gafe elekere asaa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMmachị ọchị ehi

Ụlọ ntaakụkọ Sun News nke Naịjirịa dere na otu onye e gbụrụ bụ Collins Ojierakhi bụ nwataakụkọ na mahadum Ambrose Alli di n'obodo Ekpoma nke steeti ahụ.

Ndị ma maka ihe a mere kwuru na Collins na ndị enyi ya na-ala obodo ha mgbe ha jekwuru ndị ọchị ehi jiri ehi gbachie ụzọ.

Nna Collins bụ Maazi Festus Ojierakhi, siri na ihe a mere gbagwojuru ya anya, "A nọ m na-eri nri ka ọ na-ewete aka n'elekere asatọ, mgbe m jụru ese ọkpara m e wee gwam na ya na ndị enyi ya ji ogbatụmtụm ga ozi. Ka okụrụ elekere itoolu, nne enyi Collins tịwawara mkpu na ndị ọchị ehi egbuola nwa ya. dịka m gbapụrụ ezi, e wee gwam na nwam soo n'ime ndị nwụrụ.

"Anyị gbagara ebe ihe a mere wee hụ na ndị uweojii buru ozu ha gawa ụlọọgwụ."

BBC Igbo gara mbo iwete onye na ekwuchịtere ndị uweojii na Edo Steeti bụ Emeka Iheanacho mana ekwenti ya agaghị.

A na-ebo ndi ọchị ehi ebubo maka ogbugbu mmadụ n'ebe dị icheiche na Naịjirịa.

Gọọmenti Muhammadu Buhari, bụkwa onye Fulani, sị na ha na-agba mbọ ịhụ na ogbugbu mmadụ a kwusiri kpam kpam.

Isiokwu Ndị Emetụtara