Nri ndị Igbo: Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri

Ụkwa
Nkenke aha onyonyo A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu ewere mkpụrụ ya

Ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri.

Ụkwa nwere osisi nke na-amịpụta mkpụrụ ụyọkọ buru ibu nke Bekee na-akpọ 'breadfruit'. Azụ mkpụrụ ụyọkọ ya na-acha akwụkwọndụ akwụkwọndụ, ebe mkpụrụ mkpụrụ dị ya n'ime na-emepụta ihe anyị na-akpọ ụkwa.

Ụyọkọ ụkwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapụ ya ka ọ ree ure tupu a kụwaa ya ma wepụta ụkwa nke a na-esi esi. Ya mere ndị Igbo ji asị na 'ụkwa ruo oge ya ọ daa'.

Tupu e rie ụkwa, ọ ga-agabiga ụzọ dị icheiche dịka:

  • Isi ya esi
  • Ighe ya eghe
  • Maọbụ ịhụ ya n'ọkụ

Ngwa nri eji esi ya

  • Ose
  • Nnu
  • Ụkwa
  • Mmanụ nri
  • Ụfọdụ na-etinyekwa yabasị, maggị nakwa ịsha
  • Ụfọdụ na-etinye azụ ọkpọọ ebe ụfọdụ na-etinye akwụkwọ nri
  • Ụfọdụ na-etinyekwa mkpụrụ ọka
  • Ụfọdụ na-etinyekwa ogiri
Nkenke aha onyonyo "Ụkwa ruo oge ya ọ daa"

Etu esi esi ya

Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu isie ụkwa gị:

  • Saa ụkwa gị mmiri ọfụma iji hụ na aja maọbụ kịrịkịrị okwute adịghị ya n'ime.
  • Wunye ya n'ime ite tụmadụ nke bekee kpọrọ 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ọfụma
  • Ụfọdụ na-etinye akanwụ maọbụ ngọ iji mee ka o dee ma ghee ọsịsọ
  • O ghewe nakwa mmiri dị n'ime ya tawa, tinye ya ose akwọrọ akwọ, mmanụ nri na nnu
  • Hapụ ya ka ya na ngwa nri ndị ị tinyere n'ime ya sụkọta ọnụ
  • Kpagharịa ya ma hapụzịa ya ka ọ nọrọ n'ọkụ dee ede ma ghee ọfụma
Nkenke aha onyonyo Ụkwa bụ otu nri nwere ụtọ nke ya ị ga-erinwu ma ị tinyere maọbụ itinyeghị ngwanri ọbụla

Etu esi eri ya

A bịa n'ụfọdụ obodo dịka Urualla dị n'Imo steeti, ha anaghị azapụ mmiri e ji sie ụkwa ha. Ha na-aṅụ mmiri ya iche ma riekwa ụkwa ha iche.

Ụfọdụ anaghị etinye mmanụ nri n'ime n'ụkwa ha, ebe ụfọdụ na-ahapụ mmiri ụkwa n'ime ya nke bụ na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri.

A na-eghekwa mkpụrụ ụkwa eghe, jiri akị etiri eti maọbụ akị bekee taa ya.

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ụkwa eghere eghe atagharị ọnụ

Etu esi echekwa ụkwa

A na-agba ụkwa n'anwụ ka ọ kpọọ tupu a gbaa ya n'akpa maka ndị ga-azụta ya iji aga ala bekee.

Tupu ị sie nke kpọrọ akpọ, banye ya na mmiri site n'abalị ruo mgbe chi foro n'ụtụtụ. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ọfụma ma ghee ọsịsọ mgbe ị ga-esi ya.

Ihe ọ na-enye n'ahụ

Nchọpụta ndị ọkachamara sayensị chọpụtara gosiri na ụkwa nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma n'ahụ, dịka riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforụs. O nwekwara potassịọm, kọpa, iron, magnizịọm, kalshịọm, zịnkị, manganeezi, selenịụm nakwa fosforụs na vitamin C.

Ọ dị mma maka mkpụrụ obi mmadụ. Ụfọdụ na-eji akwụkwọ osisi ya asacha isi maka ọ na-egbu igu isi nke bekee kpọrọ dandruff, na-akwụsịkwa ndapụsị ntutu.

O nwekwara obere abụba kpụkọrọ ọnụ nke bekee kpọrọ saturated fats, kọlesterọl nakwa sodịọm.

Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ na-aṅụ mmiri ụkwa iche ebe ụfọdụ na-eri ya na mmiri ya

Ihe ndị ọzọ eji ya eme ị na-amaghị

  • A na-etinye ụkwa n'ime ụfọdụ mmanụ na-aba n'anya iji nye ya ụtọ (flavour)
  • A na-akwọ mkpụrụ ụkwa akwọ jiri ya mee ihe bekee kpọrọ flour
  • A na-apịpụtakwa ya mmanụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: