BBC: Anyị ga-akpọpe ụlọọrụ anyị na Lagos nwanne echi

BBC logo
Nkenke aha onyonyo BBC: Anyị ga-agbape ụlọọrụ anyị na Lagos maka ịgbasa ozi na Ọdịda Anyanwụ Afrịka

A ga-eme mmeme ahụ n'ụlọọrụ anyị dị na Ikọyị Lagos n'Elekere anọ nke ehihie Wenezde, ụbọchị nke iri abụọ na otu ọnwa Maachị afọ a.

Ndị ọbịa a na-atụ anya ha gunyere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria dịka nnukwu ndị ndọrọdọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego na ihe nkiri.

Onyeisi BBC na mpaghara ọdịda-anyawụ Afrịka bụ Oluwatoyosi Ogunseye kwuru na mgbape ahụ bụ nnukwu ihe nyere BBC n'ihi na ọ na-ehazigharị ka BBC si agbasa ozi banyere Naijiria na mba ndị ọzọ.

"Mgbape na-ehazigharị ka BBC si agbasa ozi banyere Naijiria na mba ndị ọzọ. Ụlọ ọrụ a bụ isi ụlọọrụ nke BBC na ọdịda anyanwụ Afrịka na-achịkọta agbasa ozi n'asụsụ bekee,Awụsa, Frenchị , Pijin, Igbo na Yoruba. ụlọọrụ anyị a ga na-eme akụkọ maka radiọ, onyonyo TV na dijital."

Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị ịsị ọrụ BBC na mpaghara akụkụ ụwa ndị ọzọ erutela na Lagos maka mmemme a dị oke mkpa nke Directọ BBC nke mba ụwa bụ Jamie Angus ga-esonye.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: