Ndị ọrụ gọọmentị Lagos Steeti awakpola onye ntaakụkọ BBC

Ụgbọala na-agafee
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ gọọmentị a nara onye ọrụ BBC ngwa ọrụ ya n'ike

Ndị na ahụ maka gburugburu na Lagos Steeti bụ Lagos State Minsitry of Environment naraala onye nataakụkọ British Broadcasting Corporation (BBC) ngwa ọrụ ya wee wepụ ihe niile osetere ma were ya bụ ngwa ọrụ gbalaga.

Ndị ngalaba gọọmentị a bịara ebe ndị na-arụzị ugbọala na anọ, bụ nke dịnyara ebe a na-awaufu aghighịa nke a na-akpọ Olushosun, ịgbachị ya.

Gọọmentị Lagos Steetị kpebiri na-aga agbachị mpaghara Olushosun maka ọkụ na-agba n'ime ebe a na-ekpopu aghighịa kemgbe izuụka gara aga.

O ka ha bịara ọrụ ka ha narịrị onye ntaakụkọ BBC bụ Joshua Ajayi ngwa ọrụ ya. Maazi Ajayi nọ na-agba ndị mgbachị a metụtara mgbe ndị ọrụ gọọmentị wakporo ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:

Onye du ndị a bụ Awoniyi Joshua, bu osote onyeisi na ngalaba gọọmetị Lagos ahụ.

Maazị Joshua nyere ndị ọru ya ikike ha gbachie ebe ahu ndị na-arụ ụgbọala na-anọ, agbanyeghị na ndị mmadụ na arịọ ka ha bụpụ ụgbọala andị mmadu nọ na ime ebe ahụ.

Otutu n'ime ndị ọrụ ụgbọala na-agba mbọ ịbụpụ ụgbọala dị n'ime ebe ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo BBC ebidola mbasa ozi na asụsụ anọ na Naịjirịa

Emechara nyeghachị onye BBC ngwaọrụ ya na mgbede, mana ọ mgbe onye ndụmọdụ onyenachị Lagos steetị maka mgbasa ozi bụ Idowu Ajanaku tinyere ọnu n'okwu.

Onye ode akwụkwọ Lagos Steeti bụ Abiodun Bamgboye, ka ọ na eme ka ọgbachịtere gọọmentị ọnu maka ihe ndị ọrụ ha mere, rịọ ndị ntaakụkọ ka ha kpachara anya ha ma ha na-etinye ọnụ n'okwu dị otua, maka onwere ike bute ọgbaghara, okachasị ugbua election na-abịa nso.

Mana o kwọwanughị ihe mere eji nara onye Ajayi ngwaọru ya, ka ọbụ etu ha siri mepe ya wee wepu ihe onyonyo na foto dị n'ime ya.

Tupu okwuo okwu a, onye bụ osote akana-achị ndi a na arụ ọgbọala bụ Olaniyi Adeoti gwara BBC na ndi otu ha na ndị gọọmentị a nwere nzụkọ n'otu elekere tupu ha abịa ịgbachi ebe a ha na arụ ọlụ.

"Ebe ka anyi na enweta ihe anyi ji eri nri, kedụ ebe ha chọro ka anyị ga? Gọọmentị a kwere anyi nkwa mgbanwe, mana ọ afụfụ ka anyi na ahụ.

"Ha na ata anyị ahụhụ, ha kwesiri inye anyi ohere ibupu ugboala dị n'ebe a. Ebe a na-arụ ụgbọala ruru 45," O kwuru mgbe ọ kpọrọ BBC gagharịa ebe a na-arụ ọrụ.

Maazi Adeoti, ka ndị ọzọ nọ ebe ahụ si na ụlọọrụ ha ama nwe nchekwa ma gọọmentị mechie ebe ahụ.

Onye ọzọ na ebe ahụ achoghi ka akpọ aha ha sịrị na nsogbu ha sitere n'aka ndọrọndọro ndị ngalaba gọọmenti Lagos aka ha dị na gbụrụgbụrụ na ọrụ ụgbọala.

Otu onye anya hụru ihe mere kwuru na mmechị a aka na-achị Lagos Steetị bu Akinwunmi Ambode nyere iwu ya bụ nke ebe a na-atupu aghighia na Olushosun ogbughi ebe ndi mechanic na arụ ọrụ.

Ndi ụlo ha di na gbụrụgbụrụ Olushosun na enwe ezigbote nsogbu ahuike make aṅụrụ na-akwa ha kemgbe ọku bara abe ahu na izuụka gara aga.

Ugbua, ndi bi ebe ahu ji akwa eketchi ime ha.

Na Friday, Ambode sịrị na ihe ha jiri mechie Olushosun bụ maka ebe ahu abughị ebe mmadu kwesiri ịnọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a