Mwakpo ọchịehi: Ọtụtụ mmadụ agbaala ọsọndụ na Kogi

Ụlọ gbara ọkụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Akụkọ kwuru na ndị gburu mmadụ gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ

Ọtụtụ mmadụ bị n'ime obodo dị icheiche na Kogi Steeti agbaala ọsọndụ maka ọtụtụ mmadụ egburu n'ịme steeti ahụ.

Cheta n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa nke a, ndị oji egbe a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi nwakporo obodo Agbenema, Aj'Ichekpa, Opada na Iyade nke dịcha n'ime Kogi.

BBC Igbo kporo otu nwoke akpọrọ David Faruna bi bu na Abejukolo n'ime Kogi n'elu ekwenti, o kwuru na ya na ezịnaụlọ ya agbaala ọsọndụ.

O kwuru na: "ndị agha Naịjirịa ka nọ na-obodo ndi a oge mkpamkpa a mere. Oruola izuụka abụọ ndị a ji egbe na-egbu mmadụ mana anyị ahubeghị gọvanọ na-ebe a."

Faruna kwuru na ugbua sọọsọ mmadụ ole na ole bi na obodo ndị a makana onye ọbụla agbaala ọsọndụ nke ya.

Onye na-eme ihe a?

Ndị ọchị ehi ka ha na-ebo ebubo a. Ndị putara na ndụ sị na ndị ọchịehi na sị obodo baa obodo, na-egbu ndị mmadụ ma gba ụlọ ha ọkụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-eche na ọ ndị Fulani na-akpa ike niile na-eme na etiti Naịjirịa

Ihe mpkampka na-eme na Benue, Kogi, Platue na Taraba steetị ọfụma ọfụma.

Cheta na ọ bụ na Benue ka ha gburu mmadụ iri asaa na isi n'ọnwa Janụwarị afọ a.

Azịza nke Gọọmentị

Ndị agha nọkwa n'obodo ndị a ha na-egbu ọtụtụ mmadụ. Gọọmentị ekwuole na mkpamkpa a ga-akwụsị ma ọ bụrụ na steetị di icheiche mụpụtara ọdọ ehị.

Mana Faruna ekweghị na nke a, o kwuru na: "ihe gọọmentị kwesịrị ịme bụ iji ike sa ike, sọọsọ ihe a ga akwụsị ogbugbu a na-eme na obodo anyị"

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a