Akụkọ kachasi taa: Ihe na-ewe ụmunwaanyị na Toni Kan iwe
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe maka ọchụchụ
Ndị otu ụmụnwaanyị akpọrọ Coalition of Women for Justice mere ngagharị iwe n'Enugwu iji gosi na obi adịghị ha mma maka ọchụchụ n'ọrụ ndị Globacom chụrụ ụmụnwaanyị ndị lụrụ di na ndị mụrụ nwa.
Mana ndị ụlọ ọru Globacom kwuru na ọ bụ maka na ha anaghị eme ọfụma na ọ bụghị sọsọ ndị luru dị ka ha churu n'ọrụ. Pia ebe a ka ị gụọ ya n'uju.
'Ndị na-achị ala Igbo emeghi nkeọma'
Onye odeakwụkwọ bụ Anthony Kanayochukwu Onwordi a na-akpọ Tony Kan ekwuola ka ndị na-achị ala Igbo tete n'ụra. Gere ihe okwuru n'uju n'ihe onyonyo a.
Toni Kan bụ onye ode akwụkwọ ọnụ na-eru n'okwu
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ị ma taa
- Iwobi erutela ogige ndị Super Eagles ka ha malitere ọzuzụ maka asọmpi enyi na enyi na Poland
- 'A gbara Naịjirịa ama tupu awakpo Dapchi' tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 110
- Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ ka ha na-atule ikwusi mmepụta ụgbọala n'anya onwe ya
- 'Ihe puruiche abịaala ugbua n'ime BBC' - Ngalaba Lagos emepela
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Kpalịte mmụọ m
A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu ewere mkpụrụ
Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri - ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri.
Ihe nkịrị nke taa
David Anyaele kọrọ ihe anya ya hụrụ n'obodo Sierra Leone mgbe ha na-alụ ọgụ. O kwuru na ebere ya aka nke mere na o jizi aka arụrụ e bi ndụ.
'E bere m akwa maka na abụ m onye Naịjirịa'