Akụkọ kachasi taa: Ụmụakwụkwọ Dapchi alọtala, na BBC na-agbape ụlọọrụ ọhụrụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Mwakpo Dapchi: Ụmụaka 76 ka akpọghachitere

Aha onyonyo,

Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere

Mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị naka bụ Lai Mohammed edepụala akwụkwọ gbasara ụmụaka ụmụnwaanyị Dapchi bụ ndị Boko Haram tọrọ ụbọchị 19 Feburuwarị 2018.

Lai Mohammed kwuru na iwu onyeisiala Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa ka ha chọọ ụmụaka ahụ amịtala mkpụrụ dịka ha nwetara mmadụ 101 site nime ụmụaka 101 bụ ndị a tọọrọ. Pia ebe a ka ị gụọ ya n'uju.

Taa ka ụlọọrụ BBC West Afịrịka na-emepe na Lagos

Aha onyonyo,

Solomon Mugera na-ekele ndị Igbo

Ụlọọrụ BBC nke mpaghara ọdịdaanyanwụ Afịrịka na-emepe ụlọọrụ ha dị na Lagos, Naịjirịa nye ụwa niile taa.

Nke a na-esote mbido mgabsaozi nke asụsụ abụọ dị na Naịjirịa bụ Igbo na Yoruba nime BBC ụbọchị Febuwarị 19 afọ bụ 2018.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ị ma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Kpalịte mmụọ m

BBC gara ịchọpụta ka ndị Igbo sị akpọ ''Spider''.

Aha onyonyo,

Gini bụ 'Spider' n'asụsụ Igbo?

Ihe nkịrị nke taa

Anwụrụ ọkụ kochiri ụzọ n'Olushosun n'ime Lagos wee mee ka ndị mmadu kwapụ ebe ha bi n'ike.

Aha onyonyo,

Ebe a na-awụfụ ahịhịa n'Olushosun