Ike Ekweremadu 'tụrụ asị ma zo akụnaụba ya'

Ike Ekweremmadụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu

Gọọmenti etiti akpọpụla osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka akpachie ụfọdụ ụlọ ndị o nwere na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Ha kwuru na ọ tụrụ asị n'ikwupụta akụnaụba o nwere nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct tupu o were oche ọchịchị

N'ime ụlọ ndị a, itoolu dị na Naịjirịa, asatọ dị na Dubaị, atọ dị na Flọrịda, ebe abụọ dị na Lọndọn.

Onyeisi otu nyocha na iweghachi akụnaụba Naijiria nke onyeisiala hiwere bụ Okoi Obono-Obla kwuru na Ekweremadu ekwupụtaghị akụ ya niile n'ime akwụkwọ nkwupụta odere n'ọnwa Juunu nke afọ 2007 nakwa 2015.

Ndị otu a site n'ọnụ ọkaiwu Festus Keyamo gwara ụlọikpe na-enyocha Ekweremadu maka ị da iwu ndị Code of coduct nyere ndị nọ n'ọchịchị.

Akwụkọ ha degara ụlọikpe kwuru ka-akpachie ụlọ ndị ahụ Ekweremadu nwere rue mgbe ha ga-emecha nyọcha banyere ya.

'Ebubo ndọrọndọrọ ọchịchị'

Ekweremadu site n'ọnụ onye ndụmaọdụ ya na mgbasa ozi bụ Uche Anichukwu kwuru na okwuputala akụnaụba ya niile nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct dịka e dere n'iwu.

"Ndị nyocha a jụrụ maka akwụkwọ nkwuputa bụkwanụ nke enyere haa ma ha achọghị ileba ya anya, maka ọ bụ ihe ndọrọndọrọ ọchịọchị nke 2019. Sịnetọ agwala ndị ọkaiwu maka nke a, ha ga-ezute ndị a n'ụlọikpe."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mbọ ndị BBC gbara iji nweta ndị otu Ekweremadu na ndị ụlọọrụ Code of conduct enweghị isi, dịka ha azaghị ekwentị ha.

Cheta na onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki ka na-azara ọnụ ya ugbua gbasara otu ebubo nkwuputa akụnaụba ahụ.

Nke pụtara na ndị isi ọchịchị Sịneti abụọ nọ n'ime ọgbaghara nkwuputa akụnaụba ha.