Nsogbu Cambridge Analytica: Njọ ọ dị na social media?

Facebook na Cambridge Analytica Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa

Ọ bụrụ na ị na-ege ntị ihe na-eme ugbua, i ga-anụla otu ụlọorụ a kpọrọ 'Cambridge Analytica' si na-anata ozi gbasara ọtụtụ mmadụ maka ntụliaka.

Mana ihe mere okwu sị nwe ka o sịrị dị a na nwerị ozi a n'elu social media dịka Facebook.

Onyeisi ndị Facebook bụ Mark Zuckberg na-arịọ arịrịọ na ọ bụ eziokwu na Cambridge Analytica bia websait ha narị ozi a. O kwukwara na ọ ga-agba mbọ hụ na ụdị ihe a anaghị eme ọzọ.

Ihe dịka mmadụ nde mmadụ iri ise ka ndị a nara ozi gbasara ha mana ọ dị ka ọnụọgụgụ ha karịrị nke a.

Ka ọ sị gbasara gị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mark Zuckberg na-arịọ arịrịọ

Facebook nwere mmadụ ruru ijeri abụọ na mba ụwa n'elu websait ha, ngịnwa so na ha.

Ọtụtụ oge, ị ga-ejị ọsịsọ pia 'oo' maọbụ 'ekwe m' mgbe ị chọrọ ị nata app ha maọbụ ị hụ ihe a kpọrọ 'Terms and Condition' na bekee mana ị naghị a gụọ ihe a dere ọfụma ka ị chọpụta ihe ụlọọrụ a ji ozi nke a eme.

Ụfọdụ mmadụ kwuru na akwụkwọ ozi a toro ogologo, ma dị kịrịkịrị n'anya.

Ebe ọ bụ na onweghị ihe ọjọọ mere ndị ọzọ, onweghị ihe ọjọ ga-eme gị.

Ọ bụghị etu a.

Ka o si bụrụ na ị ga-aza ajụjụ nlele dịka; 'Kedụ nrị dị gị mma n'ahụ?' Maọbụ kedụ otu ndọrọndọrọ ị na-enye nkwado? Ha ga-enye kwa gị azịza ụfọdụ. Ụfọdụ oge, ha ga-enweta ya, ụfọdụ oge anaghị enweta ya, onye maa ebe azịza niile na-aga Onweghị

Ka osị metụta Naịjịrịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ala Naijiria nọ na Facebook

SCL nwere ụlọọrụ Cambridge Analytica tinyere aka na ntụlịaka ala Naịjirịa nke afọ 2015.

Otu akụkọ sị ụlọọrụ ntaakụkọ Guardian kwuru na otu onye Naịjịria bụ nnukwu mmadụ nyere Cambridge Analytica ọrụ ijeri naira ka ha gba mbọ hụ na Goodluck Jonathan laghachiri n'ọkwa ọchịchị.

Akụkọ a kwuru na nwoke a nyere ha ego ruru nde dọla abụọ na asatọ maka ịgbasa ozi ga-emebi ọsọ ịzọ ọchịchị nke Mohammadu Buhari.

Akụkọ kwukwara na Cambridge Analytica banyere n'ime imale nke Buhari.

Nsogbu a emetụtaghị sọ ala Naịjirịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Uhuru Kenyatta onye isi ala Kenya

N' ala ndị ozọ dịka Kenya, Cambridge Analytica kwuru na ha rụrụ ọrụ n' afọ 2013 na 2017.

Ọtụtụ mmadụ hụrụ na ntụlịaka ala Kenya mere n'afọ 2017 nwere ọtụtụ ozi asị sị Facebook na Whatsapp pụta.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a