Akụkọ kachasi taa: 'Ike Ekweremadu tụrụ asị' na ụmụwkụkwọ Dapchi

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Ụmụaka Dapchi ezutela Buhari

Ụmụakwụkwọ Dapchi a gbapụtara

Ebe foto si, Reuters

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, kwuru na ọ bụ ndị ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị otu narị na ise na otu nwoke ha gbapụtara n'aka.

Ka ọ si dị onweghị onye ma ọnọdụ ụmụaka ise ndị e kwuru na ha nwụrụ 'ime ndị a tọrọ. Gụọ ya n'uju ebe a.

Ike Ekweremadu 'tụrụ asị ma zo akụnaụba ya'

Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu

Gọọmenti etiti akpọpụla osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka akpachie ụfọdụ ụlọ ndị o nwere na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Ha kwuru na ọ tụrụ asị n'ikwupụta akụnaụba o nwere nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct tupu o were oche ọchịchị. Pia ebe a ka i gụọ ya n'uju.

N'Enugwu, onye NSCDC egbuola mmadụ atọ n'Enugwu

Gọọmentị nyere ndị NSDC ikike ibu egbe afọ ole na ole gara aga

Ebe foto si, Getty Images

Ihe dịka mmadụ atọ bụ ndị nwụrụ anwụ oge onye ọrụ nchekwa nke akpọrọ NSDC n'aha ịchafụ gbara egbe ụgbọala ha nọ n'ime ya.

Akụkọ kwuru na ihe ọdachi a mere na Miliki Hill dị na Ngwo n'Enugu steeti. Gụọ ya n'uju ebe a.

Nsogbu 9mobile: Teleology akwụọla nde $50 iji zụta

9mobile meriri Glo, Airtel na Alheri iji nweta

Ebe foto si, AFP

Teleology Holdings ritere uru ị bụ ndị nwere isiọma izụ 9mobile n'ụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a.

Enyere ụbọchị taa ka ha kwụnye ego ahụ, maọbụrụ na ha akwụnwụ ya, a ga-akpọ ụlọọrụ, Smile Telecoms Holdings, ka ha wegharịa 9mobile. Gụọ ya ebe a.

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Kpalịte mmụọ m

Kelechi Angela Anyanwu bụ nwata nwaagbọghọ na-akpa isi kwuru na ịkpa isi bụ ihe ọ mụtara n'aka nne ya.

Aha onyonyo,

Uru ịkpa isi bara

Ihe nkịrị nke taa

Lee ka ndị ụlọorụ anyị, dị n'asụsụ dị iche iche: bbcnewspidgin, bbcnewsyoruba, bbchausa, bbcafrica, si wee tee egwu na Maachị 21! #BBCWAfricaLaunch