Ndịagha asaala TY Danjuma maka ndị ọchiehi

T Y Danjuma Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'afọ 1976, T Y Danjuma bụ onyeisi ndịagha Naịjirịa

Onye bụbụ onyeisi ndịagha Naịjirịa, ma rụkwa ọrụ ka Minista na-ahụ maka nchekwa obodo nke bekee kpọrọ 'Minister of Defence' n'okpuru Olusegun Obasanjo bụ onyeisiagha TY Danjuma, kwuru okwu dara ụda ụnyaahụ ka ọ nọ n'emume iji sị ndị gụchara akwụkwọ daalụ nke e mere na mahadu, Taraba steeti dị n'isi obodo Taraba bụ Jalingo.

Danjuma sị ka ndị Naịjirịa chekwaa onwe ha maka na ndịagha Naịjirịa na ndị omekome na-egbu mmadụ n'ebe dị icheiche na-arụkọ.

Ka okwu a yabụ okenye kwuru ka na-erugharị, ndịagha Naịjirịa tinyere ọnụ na ya, wee sị:

"Anyi nụrụ ihe okenye a a na-asọpụrụ kwuru, mana anyị achọghị ịsa ya okwu. Mana, onwere ebe anyị chọrọ ido ndị be anyị anya.

"Ọ bụ ndịagha Naịjirịa ka e nyere ikike ịchekwa Naịjirịa ma nyekwa ndị nkịtị aka ma-agwa ha mee etu a. Maka nke a, ehibere atụmatụ nchekwa anyị kpọrọ 'Ọsọ buusu' n'usoro iwu na-achị Naịjirịa.

"Ya mere eji zipu ndịagha ka ha gaa gbochie ike ndị ọchiehi na-akpa n'etiti Naịjirịa, na ebe ndị ọzọ. Kemgbe ebidoro "Ọsọ buusu", gọọmentị Taraba akwadoghị atụmatụ a, maọbụ nyere ndịagha aka etu okwesịrị.

"N'agbanyeghị agwa a, ndịagha Naịjirịa akwụsịghị ọrụ nchekwa ha na Taraba, nke butere ogbugbu e gburu otu n'ime ha n'ụbọchị 16 nke ọnwa Maachị n'afọ a."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMmachị ọchị ehi

Ozi a ndịagha Naijiria zipuru gakwara n'ihu na-asị ka ndị Taraba nakwa ndị Naịjirịa niile na-aga n'ihu na-eme ihe ha na-eme ka o kwesịrị.

BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ onye na-ekwuchitere gọvanọ Taraba Steetị nakwa onye na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu mana ha azaghị ekwenti ha.

Anyị ga-ewetere unu ozi ma anyị nweta ya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara