Okwu Naịjirịa na Boko Haram ọ ga-akwụsi agha?

Ndịagha Naịjirịa Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram

Okwu na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua bụ na ndị Boko Haram na gọọmentị Naịjirịa na akpakọrita uka banyere etu a ga-esi were belata maọbụ kwụsị mgbọ a na-akwa n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.

Nke a bụ mbụ gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ya na Boko Haram na-akpakọrita ụka na nsọ a. Onye kwuru maka olileanya a bụ Lai Mohammed, bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi.

Akpam ike Boko Haram, n'agha Naịjirịa na-ebuso ha egbuola mmadụ puku kwuru puku kemgbe 2009 nsogbu a bidoro. Mana ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari na-ekwu na mbụ na ọ ga-amasị ha ka akpakọrịta ụka.

Lai Mohammed kwuru n'ozi o zigara ndị ntaakụkọ iji kọwa etu e siri gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi na,"Ọtụtụ mmadụ amaghị, mana anyị na-akpakorịta ụka ịhụ ma anyi na ndị ọlụọla a aga-ekweta ka akwụsịlata ịkwa mgbọ."

Ndị Boko Haram kpọlatala ụmụaka ahụ n' ụbọchị 19 nke Febụwarị.

Image copyright Isaac Linus Abrak
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka ise nime ụmụ Dapchi ahụ nwụrụ oge a kpọrọ ha

Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ise n'ime ha nwụrụ ka e ji ha, dịka aka ka ji otu onye n'ime ha.

Mohammed kwuru na nkwụsịlịta ịkwa mgbọ nke izuụka bidoro n' ụbọchị Maachị 19 nke afọ a nyere ohere iji kpọlata ụmụaka a.

Akwụkwọ ozi Mohammed kọwara na ọ bụ mmadụ 111 ka a tọọrọ na Dapchi, nke bụlitere ọnụọgugụ ndị a tọrọ site na 110 ha kwuru na mbụ.

Akpọghachịrị ụmụaka Dapchi ahụ oge ụka ka ha siri Abuja ebe ha gara ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari lọta.`

Nkewa dị na Boko Haram

Mohammed Kwuru, "Anyị nwere ohere itinye ọnụ n'okwu ndị ọzọ mgbe a tọrọ ụmụ Dapchi."

O mechara gwa ndị ntaakụko Reuters n'ekwentị sị:"Ihe anyi na-ele anya bụ ka igba egbe a kwụsị kpam kpam."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAgaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere

Mana, amaghị otu Boko Haram nke ha na gọọmentị Naịjiria na-akpakọrịta ụka ugbua.

Al-Barnawi bu onye a na-eche na ọ bụ nwa Mohammed Yusuf, bụ onye bụ isi sekpụ ntị na Boko Haram bụ onye a na-eche na ọ bụ ya kpara ike Dapchi, ebe Abubakar Shekau bụ onye na-achị otu Boko Haram ọzọ.

BBC gbara otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Maazị Chris Kehinde Nwandụ ajụjụ ọnụ gbasara ihe gọọmentị kwesịrị ime.

Maazi Nwandu kwuru na okwu a Naijirịa na Boko Haram na-ekwu abaghị uru cha cha, maka ndị Boko Haram akwụsịgbeghị ike ha na-akpa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Chris Nwandu maka "ceasefire"

Nsogbu gbasara Boko Haram aghasaala mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke ugwu Naịjirịa kamgbe o bidoro n'afọ 2009.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a