Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: gọmentị na Boko Haram

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere ụtụtụ a n'ichafu:

Lai Mohammed sị na gọọmentị Naịjirịa na Boko Haram na akpakọrịta ụka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mkpebi ekpebiri maka ịkwụsilata ịkwa mgbo mere ejị nwee ohere ịkpọlata ụmụakwụkwọ Dapchi

Gọọmentị Naịjirịa na ndị otu oyiegwu Boko Haram na-eme kpakọrịta ụka iji mara ka agha ọ ga-ebe n' ọwụwa anyawụ ugwu Naịjirịa.

Onye gwara ndị ntaakụkọ maka olileanya a bụ Lai Mohammed, bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi.

Nke bụ mbụ gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ya na Boko Haram na-akpakọrita ụka na nsọ a.

Akpam ike Boko Haram, n'agha Naịjirịa na-ebuso ha egbuola mmadụ puku kwuru puku kemgbe 2009 nsogbu a bidoro. Mana ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari na-ekwu na mbụ na ọ ga-amasị ha ka akpakọrịta ụka.

Ụnụ anụla na a na-ebuso Ekweremadụ agha maka akụ na ụba ya a sị na odepụtachaghị mgbe ọzọ ọchịchị na 2015.

Image copyright nassnig.org
Nkenke aha onyonyo Sịnatọ Ekweremadụ na-anọchite anya ndị Enugwu West Senitorial Distrikt

Osote Onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadụ agwala ndị ọ na anọchịte anya ha n'ụlọọmeiwu ha egekwala ntị maka ebubo a na-ebo ya maka akụ na ụba ya a sị na ọ deputachaghị.

Ekweremadụ kwụrụ na ọ bụ ndọrondọro ọchịchị nke 2019 bụtere ya bụ mmegheri anya.

Na mba Amerika

Stormy Daniels bụ nwaanyị ahụ jị ihe ngosi mmekọ nwoke mere akaọrụ ekwụọla ka esiri dọọ ya aka na ntị ya anwakwala anwa kwete na ya na Onyeisiala Trump nwere mmekọrịta na afọ 2006.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Stormy Daniels etinyela ọchichị Trump na gbagharịa

Trump na ndị okaikpe ya na-agọ na aka ya metukwa ụtụ, ọkpa ya metụkwa ụtụ charaacha na ya bụ ikpe.

N'egwuruegwu

Blessing Okagbare bụ onye ejị mbọmbọ ọsọ mara apiariela

ọbọegwụ Bekee record na ọsọ nke 200 meters agbara na Wes Kittley.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Okagbere bụ onye kacha agba ọsọ na 200 m nke ụmụnwaanyị mba Afrịka dịka o jị otu okwa ahụ na Naịjirịa

Okagbare ji ihe dịka tinkọm tinkọm iri abụọ na abụọ mekaria ihe ogbo ya bụ Mary Onyali mere na Switzerland n'afọ 1996.

Blessing ga eso gaa egwuruegwu nke commonwealth na Austrialia na onwa Eperelu.

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Maka Dapchi

Ị chọrọ ịmata ka esi kpaa nkata ịtọpụ ụmụakwụkwọ Dapchi na agbụ? Pịa aka ebe a

BBC na-egosi unu ihe mere nu ka Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ 110 na Dapchi.

Afọ 2018

  • Ụbọchị iri na itoolu nke Febrụwarị

    Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri na itoolu nke Februwari

    Gọọmenti Naijiria kwuru na ụmụaka ụmụnwaanyi otu nari na iri(110) na-efu

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na otu nke Febrụwarị

    Gọọmenti Yobe steeti kwuru na azọpụtala ụmụaka ụmụnwaanyị n'aka ndị oyi ndụ egwu tọrọ ha, ma kwukwa na ha na ndị agha nọzị.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Febrụwarị

    Gọọmentị Yobe steeti rịọrọ mgbaghara sị na ha duhiere ọha mmadụ sị na 'onweghị nwata azọpụtara'.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na atọ nke Febrụwari

    Onyeisiala bụ Buhari kwuru na mwakpo ụmụakwụkwọ Dapchi bụ 'ọdachi mere ala anyị nile'

  • Ụbọchị ịrị abụọ na ise nke Febrụwarị

    Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha zipuru ụgbọelu na ndị agha ha ị ga chọọ ma gbapụta ụmụaka ahụ.

  • Ụbọchị iri abụọ na isii nke Febrụwarị

    Ndị agha Naijiria gọọnarịrị ebubo Gọvanọ Yobe steeti bụ Ibrahim Gaidam boro na ha kpọpụrụ ndị agha n'obodo Dapchi tupu a tọrọ ụmụaka ahụ.Ndị agha kwetara na kpọpụrụ ndị otu ha maka na 'echekwara obodo ahụ'

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na asaa nke Febrụwarị

    Gọọmenti etiti hiwere kọmiti mmadụ iri na abụọ iji nyocha ọnọdụ ejiri ntọrọ ma wepụta ozi zuru oke gbasara 110 na-efu.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na asatọ nke Febrụwarị

    Odeakwụkwọ UN bụ Antonio Guterres "katọrọ ebe ọ dị ukwu mwakp na ntọrọ ahụ".

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị

    Akụkọ kwuru na onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Aisha Wakil, nke a ma dịka ‘Mama Boko Haram' kwuru na otu Boko Haram nke Barnawi gwara ya na ha ji ụmụaka ahụ.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị

    Ụmụnwaanyị mere mgagharịiwe maka ntọrọ ahụ n'Abụja ka ọ gachara izuụka atọ.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Maachị

    Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na a na-akwado inwe mkparitaụka maka mgbapụta ụmụaka ahụ a tọrọ. kama ji ike ndị agha tọpụta ha.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Maachị

    Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem ya nke mbụ na Dapchi, bụ ebe o kwere ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-azọpụta ụmụaka ahụ a tọrọ.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Maachị

    Otu Amnesty International kwuru na ndị agha Naịjirịa e geghị ntị n'ama a gbara ha otụtụ oge tupu ndị oyi ndụ egwu a awakpo obodo Dapchi.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  • Ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị

    Gọọmentị Naịjịria mara ọkwa na-atọhapụla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị dị otu nari na anọ(104) n'ime otu nari na iri(110) bụ ndị a tọrọ

    Gụọ ya n'uju ebe a

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa