2019: Mmadụ anọ chọrọ ịna Buhari ọkwa ya

Ahmed, Fela and Yul Image copyright Ahmed Buhari/Fela Durotoye/Yul Edochie
Nkenke aha onyonyo Naijiria ga eme ntuliaka n'afọ 2019

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC n'aha ịchafụ enyebeghị iwu ka ndị chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'afọ ahụ bido ozi ịchụ nta votu, mana nke a akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ebunobi ha maka ya.

O dobeghị anya ma onyeisiala Muhammadu Buhari ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'ihi na o jibeghị ọnụ ya kwuo na ya ga-azọ.

Mana ihe doro anya bụ na o nwere ndị atụghị anya kwupụtara na ha chọrọ ka ha na onyeisiala tinye ụkwụ n'otu traụza na ntuliaka na-abịa.

Ndị a bụ ndị ntorobia, ndị ama n'ọrụ dị icheiche dịka ijiegoachụego, ime ihe nkiri, na nkuzi:

Ha bụ:

1. Ahmed Buhari

Ahmed Buhari,onye a mara dịka'Ahmed Bee' bụ onyeisi na ihe gbasara technuzu.

Buhari, dị afọ iri atọ na itoolu(39) kwuru kemgbe 2016 na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.

Nwa amadi ahụ nke enweghị ka ya na onyeisiala Buhari siri metụta kwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ebunobi ya ịchịkọta Naịjiria ọnụ ka udo di, gba mbọ ka enwe nchekwa ya na ọrụ n'obodo.

2. Yul Edochie

N'ọnwa Janụarị, onye na-eme ihe nkiri ama bụ Yul Edochie kwuru na igwe okwu instagram na ya nwere ike ịzọ ọkwa onyeisiala ma agbanyeghị na ya emerighị ntuliaka Gọvanọ Anambra nke o soro zọ.

3. Fela Durotoye

A mara Fela Durotoye dị ka onye ọka okwu ji ya agba ndị mmadụ ume mana ọ bụ nwa na-awụ ahụ n'afọ n'afọ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Mana nke a akwụsịghị ya ikwupụta na ya ga-azọ. Dịka ọ siri kwuo, oge kwalite ala Naịjiria eruola.

"O tela anyị hapụrụ ndị ọzọ dịka ndị ọrụ gọọmenti, ndị mba ọzọ na na otu mba ụwa ọrụ ikwalite obodo anyị. Anyị hapụrụ ọrụ ime ka Naijiria bụrụ nnukwu obodo n'aka mmadụ ole na ole ndị gosirila anyi ugboro,ugboro na ebumobi dị na ọganighu onwe ha, na abụghị ndị ala anyị maọbụ ọhanaeze. Oge eruola oge iji gbanwe ọnọdụ a."

4. Olufumilayo Adesanya-Davies

Olufumilayo Adesanya-Davies bụ onye ọkammụta na ngalaba asụsụ na nka nzisa ozi nke a kpọrọ'Language and Communication Arts' na mahadum, 'Rivers State University of Education,' bụ sọọsọ nwaanyi kwupụtarala mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ na-abịa.

O kwuru: "A na m ele anya ịbụ onyeisiala Naijiria. Achọrọ m itinye ochi n'ọnụ mmadụ niile."

Mana Adesanya-Davies ekwughị pati ọ ga-eji zọọ ọkwa ahụ.

Na nsonso a, okwu na-ada bụ mkpa ndị na-eto eto iweghara ọchịchị nn'aka ndị aka ochie. Nke a kpalitere mkpaliteụka #notooyoungtorun na'eelu igwe okwu intanet.

N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu guntyere, Olusegun Obasanjo akpọọla ụmụnwaanyị oku ka ha sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị.