Naịjirịa na Switzerland enwela nkwekọrịta maka ego Abacha

Sani Abacha Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Abacha nwụrụ na ọche ka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1998

Gọọmentị Naịjirịa na nke mba Switzerland binyere aka n'akwụkwọ ma kwekọrịta na Switzerland ga eweghachịte ego ndị mmadụ zuuru na Naịjirịa wee dobe na mba ahụ.

Switzerland kwuburu n'ọnwa Decemba afọ gara aga na ha ga-ewechịte ego ruru dollar nde 321 ha nwụchikọrọ n'aka ezinaụlọ onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Sani Abacha site na nkwekọrịta ụlọakụ mba ụwa hazịrị.

Kemgbe ọ banyere n'ọchịchị na afo 2015, onyeisiala Muhammadu Buhari na-arịọ enyemaka site n'aka ndị mba ụwa dị icheiche ka ha nye aka hụ na ego o kwuru nasa ndị nọbụ n'ọchịchị na Naịjirịa zuru.

Onye na nkwuchiteọnụ Buhari kwuru n'akwụkwọ nkwekọrịta a e binyere aka bụ ihe ga-ejikọ Naịjirịa, Switzerland na ndị International Development Associations (IDA), bụ atụmatụ ụlọakụ mba ụwa (World Bank) na mba ndị dara ogbenye.

"Iweghachi ihe e zuru n'ohi ga-enyere ọchịchị anyi aka ịchụ mpụ na aghụghọ, ma nyekwa aka itinye ego n'ọrụ mmepe obodo dị mkpa," Onye na ekwụchịtere gọọmentị kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara