Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ndị ntorobịa Naịjirịa katọrọ Buhari

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Ndị ntorobia Naịjirịa zukọrọ maka ọchịchị Buhari.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ntorobịa ndị na-si n'agbụrụ dị icheiche na Naịjirịa

Otu jikọtara ndị ntorobia ndị Ugwu, Ọhaneze, Yoruba, Ijaw nakwa otu ndị ntorobia ndị ọzọ na Naịjirịa zụkọrọ na Abuja ụnyahụ.

Otu ndị a gbakọro ọnụ katọọ ọchịchị gọọmenti Buhari sị na ọnweghị ihe ha rụpụtara.

Ndị tinyere aka n'akwụkwọ ọkwụ a bụ Shettima Yerima, Okechukwu Isiguzoro, Oweilaemi na Eric Oluwole.

Mba Swizaland na Naịjirịa ekwekọritala maka mpụ.

Nịaịjirịa na Switzerland abinyele aka n'akwụkwo maka ịmalite ịweleta ego Naịjirịa ezupuru na mba.

Image copyright Muhhamadu Buhari/ Facebook
Nkenke aha onyonyo Ego a na-ekwu na Abacha bugara mba Swizaland na-aba na ijeri naịra

Ndị mba ahụ kwere nkwa na ha ga enyechị Naịjịrịa akụ na ụba ha dị na mba ahụ, ọkachasị ndị Abacha wepụrụ mgbe ọdị ndụ.

Na mba ofesi

Ihe ruru mba 20 na Yurope nakwa US etinyela aka chụpụ ndị Rọshịa na-arụ nyocha nzuzo n'obodo ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo UK na Rọshịa nọ na dọga dọga maka nsị e nyere onye mba UK

Mba Amerika na Europe agbakọla ọnụ chụpụ ihe karịrị narị mmadụ ndị nnọchịteanya mba Russia ụnyahụ bụ Eke.

Mba abụọ a gbarụrụ ihụ maka nsi a na-ebo na Russia jiri gbuọ Sergei Skripal na ada ya nwaanyi bụ Yulia na England.

N'egwuregwu

Iheanacho agaghi eso sọọ mpi enyi na enyi dị n'etiti Serbia na Naịjirịa

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Iheanacho so gbaa bọọlụ nke Naịjirịa na Poland

Nwafor Igbo bụ kelechi Iheanacho na ogbo ya bụ shehu Abdulahi agaghị esọ gbaa bọlụ enyi na enyi nke a ga agba na Serbia ụbọchị Tuzde na abịa.

Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr si na mmadụ abụọ merụrụ ahụ. Ha ndo. Anụ gbanaa taa echị bụ nta.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị Igbo na-ekwu mkpa ha gbasara ọchịchị ala Naịjirịa

Ị ga-emenwu ka anụmanụ?

Lekwa nwaamadi na-eje mkpọtụ ụmụanụmanụ ọfụma.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a