Onye mere Pọnzi: MMM gwuru m chacha ruru nde 3.7

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị mere MMM na-eru uju na ha enweghizi olileanya maka ọnwụ Mavrodi

Nwaafọ Naịjirịa mere MMM nke kpọrọ onwe ya Chikaodili (ọ bụgh ị ezigbo aha ya) ekwupụtala etu ya na atụmatụ pọnzi bụ MMM siri gaa n'afọ gara aga.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ tufuru ego ha site na atụmatụ MMM a.

Ndị ụlọọrụ Nigeria Deposit Insurance Corporation kwuru na ụmụ Naịjirịa soro na ya bụ atụmatụ riri nde atọ na ọma n'ọnụọgụgụ ebe ego furu oge MMM kwasara ruru ijeri 18.

Akụkọ kwukwara na o nwere ndị nwere ọbara mgbalielu oge ọ kwasara maka ego ha niile ha mefuru.

Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ihe kpatara ụmụ Naịjirịa jiri tinye aka na ụdị atụtmatụ ahụ.

N'okwu onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara okwu akanaụba bụ Rotimi Obende kwuru: "Eziokwu bụ na ụmụ Naịjirịa ka ga na-emefu ego n'ụdị ihe a.

"Nke a bụ maka na ọbụghị ihe niile a na-etinye ego na-egosipụta onwe ha mana n'okpuru, ha dịkwa n'ụdị MMM.

Ihe ise gbasara MMM

Image copyright AFP
  1. GH - Nke a ka a na-akpọ oge mmadụ chọrọ iwere ego o tinyere
  2. PH - Nke a na-ekwu maka oge mmadụ chọrọ itinye ego
  3. Guider - Nke a dịka onye ndu bu onye na-agbaziri ndị na-eso ya ụzọ. Onye a na-enwetakwa pasenti 2.5 n'ego ọbụla ndị nọ n'okpuru ya tinyere
  4. Mavro - Nke a ka a na-akpọ ego na MMM. "Mavro" ole mmadu nwere pụtara ego ole onye ahụ nwere. Nke a si n'aha onye bidoro MMM bụ "Sergei Mavrodi"
  5. Referrals - Ndị a bụ ndị mmadụ kpọbatara, ndị nọ ya n'okpuru dịka ndị osote ya. Onye ọbụla kpọbatara mmadụ na-enweta pasentị n'ego ọbụla onye ọ kpọbatara tinyere.

"Dịka m na-ekwu ugbua, o nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-etinye ego ha ugbua dịka nke a kpọrọ "Kripto Currency", nke gbasara "real estate" wdgz."

O kwuru na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-achọ ịbanye azụmahịa ọbụla nyocha ya nkeọma ka ọ mara ihe ọ na-abanya na ya.

N'okwu ya, "Ihe kpatara ihe niile ji eme bụ maka anya ukwuu, ndị mmadụ chọrọ iri ebe ha na-akụghị."

Ọtụtụ ndị ọnụ na-erụ n'okwu ekwuola na ụdị ihe a bụ "fonfoju akpa".

Akụkọ ga-amasị gị:

A kọwara na MMM na-enye ndị mmadụ ihe ruru pasenti 30 n'elu ego ole ọbụla mmadụ tinyere rue mkpụrụ ụbọchị 30.

Ọ na-etinyekwa pasenti ise ọzọ n'elu pasenti 30 ahụ ma ọ karịa mkpụrụ ụbọchị 30 ahụ.

Onye ọ bụla mmadụ wetara, onye wetara ya ga-enweta pasenti 2.5 n'elu ego ọbụla onye o wetara tinyere.

Ọtụtụ ndị bidoro na mbu atụmatụ ahụ rachara aka maka na ha jiri ya bụ atụmatụ gbuo ozu.

Mana nke a akwụsịghị na ọ bụ pọnzi nke megidere iwu maka na ọ bụ ụzọ weta isi bia were isi.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a