Ụlọikpe sị Abaribe kpọpụta Nnamdi Kanu

Nnandi Kanu n'ụlọikpe Abuja Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji.

Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya enyela iwu ka Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ kpọpụta Nnamdị Kanu n'ụlọikpe mgbe a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa June ma ọ bụ ha aga mkpọrọ.

Abaribe, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ El-shalom na otu onye bi na Abuja bụ Tochukwu Uchendu gbaara Nnamdi Kanu akaebe e jiri tọpụ ya n'ụlọmkpọrọ.

Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegidee ọchịchị ala Naijiria bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Septemba, afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ha oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ahụ.

Ka ebulitere ikpe ahụ, ọka iwu na ekpechitere ndị ahụ bụ Chukwuma Machukwu Umeh, kwuru na enyebeghị ha akwụkwọ ụlọikpe nke kwupụtara iw ọkụ ahụ onye ọkaikpe nyere.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Gere akụkọ mere ụnyaahụ n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNkeji BBC

Ihe nkiri

Na Facebook Live, anyị kpara maka ịdamba ntuliaka ji ndị Igbo nke bekee kpọrọ voter's apathy.

Isiokwu Ndị Emetụtara